Ochichi Enugu State Enyela Nkwado Iwe Puku Kwuru Puku Ndi Mmadu Na Olu Nkuzi Ohuru Na State A
Written by admin on July 30, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Govt Enugu State dina aka ochichi Gov Peter Ndubuisi Mbah enyela nkwado iwe na olu ndị nkuzi nakwa ndi ozo di puku isii na nari ise nyere ulo akwukwo primary na nke secondary enwegasiri na State a nke kachasi gaara ulo akwukwo Smart Green Schools di nari abuo, iri isii na asaa aruputara ohuru.
Na ozi onyefere ndi nta akuko na isi obodo Enugu unya bu Wednesday ka onye isi oche ulo olu Enugu State Universal Basic Education Board ENSUBEB bu Prof Hyginus Okibe Banko mere ka amata na ntozu oke nzere mmuta maka ohere olu a nyere ndi nkuzi gunyere: bachelor’s degree, Higher National Diploma, nke Postgraduate Diploma ma obu asambodo Nigeria Certificate in Education, gunyere ihe gosiri na ndi di etu ahu debanyere ma obukwanu amalitego usoro ndebanye aha na otu Teachers Registration Council of Nigeria, ebe ntozu oke nke ohere olu ndi ozo bu asambodo Ordinary National Diploma, nke SSCE ma obu WASSCE.
Prof Banko kowara na habu ndi aga ewe na olu nkuzi ga enweriri asambodo NYSC Discharge Certificate ma obu nke Exemption Certificate.
Ogara na iru gwa ndi nwere mmasi na habu ohere olu ka ha detara isi ulo olu ENSUBEB dina Independence Layout akwukwo anam acho olu nakwa ndeko banyere ha bu CV, ma obukwanu ziga ha na akara owa ozi ensubebofficial@outlook.com
Yabu onye Executive Chairman ulo olu ENSUBEB kwuputara na ohere ideta akwukwo anam acho olu a ga abia na isi njedebe na ubochi Friday bu abali iri na ano nke onwa ozo bu August afo a bu 2026.
