Ihu Ochị Awaala Otu IPOB Dịka Onye Ndụmọdụ Mba Israel Kpọrọ Oku Mnwere Onwe Bịafra

Written by on August 17, 2026

by Chika Nwazu

Otu Nwanyị ji ọkwa strategic advisor nyere mba Israel bụ Noga Arbel, akpọọla oku ka e mee ka Biafra nwere onwe ya, ma katọọkwa mba Britain maka ihe ọkpọrọ ọchịchị mba Britain ka dị ire na Nigeria.

Okwuru nke a n’otu mmemme egosipụtara n’igwe onyonyo Channel 14 nke mba Israel, ebe o kwuru na Biafra anọwo n’okpuru ọchịchị Nigeria ọtụtụ iri afọ site na nkwado mba Britain.

Na nzaghachi ha ka otu Indigenous People of Biafra, IPOB, kwuru na mmemme ahụ nke were ọnọdụ n’abalị iri na anọ nke ọnwa August 2026, bụ nnukwu ihe ịrịba ama na mgbasa ozi Israel na-akwado echiche nnwere onwe Biafra.

Onye nnọchi anya otu IPOB n’obodo Israel bụ Rachel Nwosu, kpọrọ ya otu n’ime nnukwu mmepe n’akụkọ ihe mere eme nke mbọ ndị otu Bịafra diplomatic core.

Nwosu kwuru na Israel kwesịrị ịrịọ gọọmentị Britain ka ọ kwụsị ihe ọ kpọrọ nkwado ọchịchị Nigeria n’elu Biafra, ma kwuo na nkwupụta a gosiri na okwu gbasara Biafra amalitela ịdọrọ uche mba ụwa.

N’agbanyeghị okwu ndị a sitere n’aka Arbel na IPOB, ọ bụghị nkwupụta gọọmentị Israel ma ọ bụ mkpebi ọchịchị Israel gbasara nnwere onwe Biafra.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited