Aka Na Achi Enugu State Emela Mkpolite Na Okwa Ohuru Gaara Otutu Umu Afo State A
Written by admin on August 20, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Aka na achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah akpolitela mmadụ iri abuo na ato ohuru na okwa ndi ndumodu puru iche ya akporo Special Advisers nakwa okwa nnukwute ndi enyemaka puru iche bu Senior Special Assistants.
Na ozi obinyere aka ma nyefe ndi nta akuko na ogige Lion’s Building nke obi govt Enugu unya bu Wednesday bu ode akwukwo ochichi State a bu Prof Chidiebere Onyia ka omere ka amata na Gov Peter Mbah kpolitere mmadu iteolu na okwa Special Advisers, ma kwuputa aha ha dika; Hon Chukwudi Ezinwa, Hon Sunday Nnamani, mazi Williams Chukwu, Prince Afam Agana, Humphrey Onyima, Hon Tony Ugwu, Chief Ernest Nweze, Hon Emeka Onunze nakwa mazi Robinson Odo.
Prof Onyia nyeziri aha ufodu na ime mmadu iri na ano nke nwetara okwa Senior Special Assistants dika: Pastor Kenneth Asogwa, Pastor Tochukwu Ogbodo, Barr Lucky Chukwu, Belonwu Nnaji, Hon Steve Odo, Hon Francis Ikewete Ede, mazi Sunny Okafor, odoziaku Eucharia Offor, mazi Kenneth Oforma, Rt Hon Innocent Emeka Ugwu nakwa ndi ozo.
Na ozi a ka Gov Mbah noro mee ka amata na mkpolite na okwa olu ndi a amalitego idi ire ozugbo.

