Agbagbuola otu onye omebe iwu ọkwa ya gbagotere na Kenya n’isi obodo ha bụ Nairobi.
Written by Onyinye on May 1, 2025
Ndị uwe ojii na mba Kenya ekwuola na mgbagbu nke agbagburu onye omebe iwu na mba ahụ ụnyaahụ bụ Wednesday n’isi ọchịchị obodo ha bụ Nairobi site n’aka ndị ji ọgba tum tum dịka nke tegoro aka e bidoro kwadowa ya.
Charles Were bụ onye omebe iwu nke parliament mba Kenya na anochite anya mpaghara Kasipul Constituency nke Kenya West ka agbagburu na Uhuruchi ụnyaahụ n’oge oji ọkara gafee elekere asaa n’oge a kwụsịrị ya n’okporo ụzọ Ngong Road nke mba ahụ.
Anya hụrụ ka ihe siri mee kwuru na onye gbara ya bụ egbe ka ebu ebu na ọgba tum tum mana ọ rituru gbaa ya bụ egbe n’ebe onye ebu n’ụgbọala na anọwa na azụ tupu ọ lọghachi azụ n’elu ọgba tum tum ma wara ọsọ.
Akụkọ ihe banyere igbu onye okwe ndọrọndọrọ ọchịchị ka e kwuru na otela anụdobere ya na mba Kenya bụ ebe ihe banyere agba ndị nkịtị nọgoro doghachi aka elekere azụ n’ime ọtụtụ afọ ndị gara aga.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.