Ahutala otutu ngbanwe n’ ikwalite onodu aru Ike ndi n’ enweghi ka ora ha na Ebonyi state dika nwa amadi.
Written by Onyinye on May 24, 2025
Ahutala otutu ngbanwe n’ikwalite onodu aru Ike ndi n’ enweghi ka ora ha na Ebonyi state dika nwa amadi ahu ji okwa Executive Secretary nyere ulo olu aru Ike na state ahu bu Dr. Divine Igwe, noro kwuputa na ihe kariri mmadu di puku iri na ano bu ndi bu nke HIV ka edebanyegoro aha ha n’ usoro nke state Health Insurance Scheme n’ agbata afo 2023 nakwa 2024.
N’ ogbako achikobara ndi nta akuko bu nke were onodu na Abakaliki bu isi Obodo state ahu,ka Dr Igwe noro rutugasia aka n’ otutu olu oma nke ngalaba health insurance Agency nke no n’ aka ochichi Governor Francis Nwifuru ruputagoro. nke ebum n’obi ya bu iweta ezi ohere aru Ike gara ndi bi na state ahu n’ amanyeghi ha oke ego okachasi ndi nke ahu nwere nje HIV na AIDS.
Okowara na Govt state ahu noro n’ afo 2023 zoo ukwu dimkpa n’ ala site n’ inye nlekota aru Ike n’ efu gara ndi olu oyibo nile na State ahu.
Omekwara ka amata na ndi ga erite erere usoro nlekota aru Ike a gunyere: umuaka ndi n’ akaribeghi afo ise, umu nwanyi di ime, ndi okenye, ndi nwere nkwaru, umu afo Ebonyi state tinyekwara ndi nile no na ngalaba nkpata ego.
Dr. Igwe kwuputara mkpa odi otu enyemaka nakwa ndi onu n’ eru n’ okwu n’ ime Obodo iruko olu kwalite olu idabanye aha ndi mmadu bu nke n’ aga n’ iru,ma rio ha ka ha chota ndi enye m aka ga edebanye opekata mpe ya buru mmadu di otu puku n’ otu Ward nyere usoro a iji nye aka gbochie onwu mberede n’ adaputakari n’ ufodu ime Obodo.
Iga echeta na obu kemgbe afo 2018 ka ulo Health Insurance Agency malitere ibelatara ndi bi na okpuru ochichi ime Obodo iri na ato nakwa onumara Ward otu nari na iri asaa n’ otu enwere na state ahu oke ego ha n’ atufu n’ ogwu ma kana agakwa n’ iru idebanye aha ndi ozo.
K’ osiladi, Dr Igwe mekwara ka amata na Ebonyi state n’ aruko olu nyere otu Global Fund iji weta usoro nlekota aru Ike n’ efu gara ndi n’ enweghi ka ora ha na State ahu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.