Aka akparala ndị oji egbe ezu mmadụ asaa na Enugu state.

Written by on March 5, 2025

Aka ndị uwe ojii na Enugu state akparala mmadụ asaa ana ebo ebubo ịgba izu ọjọọ yana iji egbe gaa ohi.

Dịka akwụkwọ ozi sitere n’aka SP Daniel Ndukwe bụ ọnụ na e kwuru ndị uwe ojii na Enugu state sịrị kọwaa, ndị ana enyo enyo ka anwụchiri site na ngalaba ndị uwe ojii akpọrọ criminal investigation department cid.

SP Ndukwe mere ka amata na ndị ahụ ka ana atụ anya n’aka ha dị na ohi e zuru ụmụ afọ ime obodo Ibagwa Nike nke Enugu state n’abalị atọ yana abalị isii nke ọnwa Febrụwarị gara aga.

N’oge anwụchiri ha ka ahutara ụfọdụ ngwa ọgụ na akọrọ ngwa ndị gụnyere egbe, mma obejiri, ihe ndị e zuru n’ohi dịka akara simcard, akwụkwọ njirimara, efe yana ọgwụ ọṅụṅụ.

O kwuru na ndị ahụ dicha n’agbata afọ iri abụọ ruo afọ iri atọ na abụọ ka aga akpupu n’ụlọ ikpe mgbe ha mechara nnyocha ha.

Ndị ahụ aka ji eji gụnyere Chetachukwu Okolo dị afọ iri atọ na abụọ, Ogwuche Chukwuemeka onye ana etu Shenkes dị afọ iri abụọ na abụọ, Ifeanyi Okoye dị afọ iri abụọ na itoolu, Sopuruchukwu Odenigbo onye ana etu Jadon dị afọ iri abụọ na asatọ, Onyebuchi Ụkwụ dị afọ iri abụọ, Chukwuebuka Chukwu onye ana etu Kobo dị afọ iri abụọ na ise yana Mmaduabuchi Ukeh dịkwa afọ iri abụọ na ise.

N’okwu ya ka Commissioner ndị uwe ojii na Enugu state bụ CP Kanayo Uzoegbu gwara ọhaneze ka ha dere duu ma gaa n’ihu na inyere ndị uwe ojii aka site n’ozi dimkpa iji belata mpụ na arụ na Enugu state.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited