Aka Na Achi Enugu State Akpolitela Onye Ohuru Dika Onye Ndumodu Mgbasa Ozi Ya.

Written by on March 20, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Aka na achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah akpolitela otu onye nta akuko ama ama bu mazi Onyekwere Nwobodo na okwa onye ndumodu puru iche nyere yabu aka na achi State na ihe metutara mgbasa ozi na udi nwa bekee kporo Special Adviser on Media.

Nke a putara ihe na isi obodo Enugu site na ozi mkpolite na okwa a banyere ndi nta akuko aka na ozuzu oke ya unya bu Thursday.

Na ozi a ka Gov Peter Mbah mere ka amata na yabu mkpolite na okwa anogori kemgbe ubochi Monday gara aga malite idi ire.

Mazi Onyekwere Nwobodo ka ozi mere ka amata na orugo olu dika onye nhazi alaka akuko uwa dika osiri metuta ngalaba ikpe akporo Judiciary Editor nyere ulo akwukwo akuko Punch Newspaper, ebe omechara gbago na okwa osote onye nhazi akuko uwa na ozuzu oke ya bu Assistant News Editor gunyere okwa nke Bureau Chief nyere mpaghara South East nakwa South South ala anyi na yabu ulo akwukwo akuko Punch Newspaper.

Nwa amadi a mechakwara gbago na okwa General Manager nakwa onye eze nhazi akuko uwa bu Editor-in-Chief na ulo akwukwo akuko Daily Star nke govt State a.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited