Akuko banyere ezi ndu na onwu Chief Micheal Ejeagha onye eji Gentleman Mike Ejeagha wee mara.
Written by Onyinye on June 17, 2025
Okwu ahu nwa afo mba United States of America ama ama na ihe omumu banyere onodu olu ako na uche akporo American psychologist bu Martin Seligman kwuru si na “mmadu imeputa ihe karie ogogo ochere na onona ya bu ihe bara uru nke ukwuu na ndu” bu noo nke putara ihe na ezi a na ndu nwa afo Enugu State kpara ike di egwu na ngalaba egwu nke akuko na egwu akporo folklore bu Chief Michael Ejeagha amakariri dika Gentleman Mike Ejeagha.
Amuru Chief Mike Ejeagha na abali ano nke onwa April afo 1930 site na obodo ya dina Imezi Owa nke Ezeagu LGA na Enugu State ebe nwa amadi a malitere obibi ndu ya na mpaghara Coal Camp nke isi obodo Enugu nyere ezinulo nna ya bu onye olu oyibo oge ahu.
Omalitere agum akwukwo ya na ulo akwukwo St Patrick’s Primary School dina Ogbete Enugu, ebe ihe banyere iku egwu sitere na nwata masiwa ya nke oma.
Gentleman Mike Ejeagha buru uzo sonyere ndi enyi ya dika nwata na egwu Ogene, ma noro na afo 1945 sonyere ndi otu egwu Coal Camp Boys, ebe ogara na iru icho akara aka ya na ihe banyere egwu oge oguchara akwukwo primary na afo 1948.
Na afo 1949 ka Chief Ejeagha malitere imu olu nyere enyi ya nwoke bu onye okpu isi nakwa onye oku egwu oge ahu bu Cyprian Ozochiawa bu ebe onoro muta ikpu isi ma gaa na iru mutakwuo ikpo ubo egwu akporo Guitar na olu bekee.
Ihe ndi a nakwa mbo ndi ozo ka Chief Ejeagha mekatara ruo na afo 1950 oge Joseph Ogbu kporo ya ka osonyere ya dika onye na akpo ubo egwu bukwanu ebe onoro malite inweta ego ugwo olu ya na ihe banyere egwu.
Mbo yabu nwa amadi oge ahu kpalitere mmuo onye jibu okwa Controller ulo mgbasa ozi Nigerian Broadcasting Service bu Atu Ona inyefe ya ohere ihe omume egwu akporo Guitar Playtime na ulo mgbasa ozi ya buzi ohere ojiri malite olu dika onye olu ulo mgbasa ozi Radio nakwa onye nhazi na mmeputa ihe omume egwu.
Chief Michael Ejeagha nokwara oge ahu guzobe nnukwute otu egwu ya okporo Premier Dance Band.
Ka osiladi, Ejeagha kposara yabu otu egwu oge aluru agha Biafra mana ogara na iru na ihe omume ya na ulo mgbasa ozi Radio bukwanu ihe omume nke akporo Igbo Paly ma buru nke ulo mgbasa ozi Radio Nigeria na adi na eweputa na ikuku oge ahu.
Tupu amalite yabu agha, Gentleman Mike Ejeagha adila na mbu yana CT Onyekwelu tiputa ufodu egwu, mana ulo mgbasa ozi onyonyo Nigerian Television Authority NTA noro oge aluchara yabu agha Biafra kpoturu Chief Ejeagha ka obia sonyere na ihe omume ulo mgbasa ozi ahu akporo Akuko na Egwu na afo 1972 bukwanu ebe onoro kpa ike di egwu nke na omere ndi mmadu ji olu oma ya na ekwu okwu ntunyere si “Akuko Mike Ejeagha”.
Mike Ejeagha noziri na oge ya dika onye oku egwu kuputa egwu di ichiche na udi akuko na egwu, ebe ufodu na ime egwu ndi ahu nwa amadi a kuputara gunyere: Uwa Ngbede Ka Mma, Elulube Lube, Enyi Ga Achi, Onye Ori Utaba, Atualu Omalu, Ebini Nwe Ude, Ome Ka Agu, Onye Nwe Ona Ebe Onye Enwero Ona Ebe, Odi Ka Adighi Eme nakwa otutu egwu ndi ozo.
Mbo Chief Michael Ejeagha kpatara otutu nkwanyere ugwu sitere na aka ndi nakwa usoro di ichiche dika ochichi Enugu State dina aka Gov Peter Ndubuisi Mbah noro na afo 2024 ruputa okporo uzo obara aha nwoke a na mpaghara Abakpa Nike nke isi obodo Enugu, ebe anokwara na yabu afo 2024 kpolite otu owara okwu ya na egwu nke ahu okporo Enyi Ga Achi bu okwu amara dika Gwo gwo gwo Ngwo nke wusara na owa ozi mmekorita ohaneze ma dotagharia otutu onyinye nrita nakwa otito gaara nwa amadi a.
Ka osiladi, na uhuruchi ubochi Friday bu abali isii nke onwa June afo 2025 ka Gentleman Mike Ejeagha mechara ihe obiara na eli uwa a ma gawa iza oku chi kporo ya na bee Chukwu Okike Abiama bu alieze enigwe dika ogbachara afo iri iteolu na ise.
Nke bu eziokwu buna Chief Ejeagha anwugo mana mkpuru oma ya na eli uwa ka di ndu ma ka gana adigidekwa okpu taru okpu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.