Ala ọma jijiji mere na mba Turkey etinyela mba ahụ n’ihe oke ụjọ ma mebisie ọtụtụ akọrọ ngwa nke ha ji e nyere ndụ aka.

Written by on April 24, 2025

Ala ọma jijiji awakpola isi obodo mba Turkey bụ Instabul ma butere ha ihe ọdachi nke ize ndụ.

Ya bụ ala ọma jijiji ka e kwuru na ọ bụ oge ọ fọrọ nkeji iri n’otu ka ọ kụọ elekere mbụ nke ehihie ụnyaahụ bụ Wednesday ka o mere ma gwuo ihe karịrị ntụ magnitude 6.2 n’ebe didobere oke osimiri nke mba ahụ.

N’agbanyeghị na o nweghị ihe ndị o mebiri dịka ọchịchị mba ahụ siri kọwaa mana aka na-achị obodo Instabul bụ Davut Gul kwuru na opekatampe ndị ruru otu narị na iri ise n’otu merụrụ ahụ n’oge ha chọrọ i gbanahụ ihe ọdachi ahụ.

Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ndị a chịrịla uche n’aka na nke ka nke ahụ nwere ike ime dịka ụdiri ihe ahụ emela n’oge gara aga.

Nkea mere ugbua na mpaghara Silivri dina akụkụ oke osimiri Marmara n’ụbọchị mba ahụ na-emerube mmemme ụbọchị ụmụaka akpọrọ children’s day.

A hụkwara ọtụtụ ụmụaka yana nne na nna n’okporo Street ka ha na agagharị ma yiricha akwa nke ha ji kwado mmemme ahụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited