ATUMATU IWU MAKA OTUTU OGIGE ARUIKE NDI OKACHA MARA OYA ANYA AGAFELA NGUPUTA NKE ABUO NA ULO NZUKO NNOCHITE ANYA NIGERIA
Written by admin on December 11, 2024
Ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti ala anyi akwadola ya gafere nguputa nke ugboro abuo bu atumatu iwu maka nruputakwuo otutu ogige aruike ndi okacha mara banyere oya anya akporo Specialist Eye Care Centres na mpaghara di ichiche nke Nigeria.
Yabu atumatu iwu na acho maka mkpatughari aka na iwu National Eye Care Centre Act eburu uzo meputa na afo 2004.
Nke a putara ihe taata bu Wednesday dika osiri di na nguputa nke ugboro abuo nyere atumatu iwu a nke obu onye Deputy Speaker ulo nzuko ahu ma jirikwa okoloto otu ndorondoro All Progressives Congress APC anochite ogbonta vote Bende Federal Constituency nke Abia State bu Rt Hon Benjamin Kalu nakwa mmadu isii ndi ozo weputara ya.
Na okwu ya tupu enye nkwado ngafere nguputa nke abuo na atumatu iwu a ka Rt Hon Kalu kowara ya dika nke na acho nkwalite ezi onodu aruike anya umu afo Nigeria na mpaghara Geopolitical Zones isii enwere na ala anyi.
Okowara na nke a bu kwere maka mmubanye nke onu ogugu umu afo ala anyi nakwa elu oji nke nsogbu oya anya na arizi na Nigeria.
Ka onutachara nririta uka nyere atumatu iwu a ka onu na ekwuru yabu ulo nzuko na okwa Speaker bu Rt Hon Tajudeen Abbas tinyere ya na usoro ntule aka nkwenyere ma obu ojuju, ebe oka na onu ogugu ndi omebe iwu ahu kwenyere na ya.
Nke a kpatara ojiri gafere nguputa nke abuo, ebe ezigaziri ya ogogo committee stage gaara otu Committee ulo nzuko ahu na ahu maka nlekota aruike puru iche.