ENUGU: Gov Mbah Akpolitela Otutu Ndi Mmadu Na Okwa Ndi Ndumodu Nakwa Ndi Enyemaka Ya
Written by admin on September 22, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ochichi Enugu State enyela nkowa na ozuzu oke banyere mmadu kariri otu nari Gov Peter Ndubuisi Mbah kpolitere na okwa ohuru dika ndi ndumodu puru iche ya akporo Special Advisers, ndi nnukwute enyemaka puru iche bu Senior Special Assistants nakwa ndi enyemaka puru iche bu Special Assistants.
Na ozi onyefere ndi nta akuko na abali unya putara taata bu Tuesday ka ode akwukwo ochichi State a bu Prof Chidiebere Onyia mere ka amata na obu yabu unya ka Gov Peter Mbah kpolitere ndi a na okwa, ebe okpolitere mmadu asaa dika Special Advisers, mmadu asato enweta okwa Senior Special Assistants, dika ndi ozo nwetara okwa Special Assistants.
Na ozi a ka Prof Onyia nyere aha ndi ahu Gov Mbah kpolitere na okwa Special Advisers dika: Chief SNC Nwagu, Dr Fidelis Odo, Augustine Okoli, Hon Pedro Nwankwo, Chimezie Nkwuo, Chief Vitalis Okonkwo nakwa Peter Andy Omeje.
Prof Onyia nyeziri aha ndi nke akpolitere na okwa Senior Special Assistants nakwa Special Assistants dika: Rachel Okonkwo, Barr Okey Ude, Hon Chinedu Chukwunweike, Barr Peter Chukwujekwu Ogbe, Chinedu Onyeagba Chukwudi Ozoeluba, Frank Udemezue, Hon Alachi Aaron Onu, Ngozi Itanyi, Hon Ikerionwu Eze, Peter Oramalu nakwa Ugwu Emmanuel Chima gunyere otutu ndi ozo.
Na ikpeazụ ka omere ka amata na mkpolite na okwa a malitere idi ire ozugbo.

