2026 UNGA – Tinubu Adila Njikere Igbaghapu Nzuko Ogbako Otu Mba Uwa Nke Afo A
Written by admin on September 21, 2026
by Chika Nwazu

tinubu-signs
Onye isi ala Nigeria bụ President Bola Ahmed Tinubu, agaghị anọ n’onwe ya na n’oge ogbako mba ụwa akpọrọ United Nations General Assembly UNGA agba nke iri asatọ n’otu nke aga-eme n’obodo New York dina mba United States.
Nke a bịara mgbe obi onyeisi ala kwuputara na Tinubu ga-alaghachi Nigeria mgbe ọgachara ezumike izu ụka atọ na mpaghara Europe.
Na ozi onyefere ndi nta akuko ka onu na ekwuru osote onyeisi ala bụ Stanley Nkwocha, kwuru na Tinubu enyela Vice president Kashim Shettima iwu ka ọbụrụ onye ga-edu ndị nnọchi anya Nigeria gaa ọgbakọ ahụ.
Ahọpụtara Tinubu na mbụ ka ọ bụrụ onye nke iri ga-ekwu okwu n’ụtụtụ ụbọchị Wednesday ga-abụ abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa , September.
Ya bụ Nzukọ UNGA nke iri asatọ na otu malitere na Septemba 8, 2026, ebe izu pụrụ iche nke ndị isi ụwa ga-adị site na September 22 ruo 29 na New York.
