Puku Kwuru Puku Ndi Otu Ndorondoro NDC Agbaghapula Ma Banye Na Nke PDP Na Enugu State

Written by on September 21, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi kariri puku mmadu isii sitere na otu ndorondoro Nigeria Democratic Congress NDC ma buru ndi sitere onumara Ward di nari abuo na iri isii enwere na Enugu State agbaghapula yabu otu ndorondoro NDC ma banye na nke People’s Democratic Party PDP na State a.

Na okwu ya na ubochi Saturday gara aga oge odu puku kwuru puku ndi a dugara ndi ndu otu ndorondoro PDP na Enugu ka onye ndu ha bu Godwin Obasi mere ka amata na ha gbaghapuru NDC kwere maka ebubo na obu ndi ana anaghi anu aha ha ka otu ndorondoro ahu roputata izoro ha okwa, dika omere ka amata na ha kpebiri ibanye PDP ma sonyere nke oma na ntule aka ọchịchị afọ 2027.

Na nke ya oge ona anabata ndi a sitere NDC ka onye isi oche otu ndorondoro PDP na State a bu Vitus Okechi kowara nke a dika ukwa dara na oge ya ma kwe ha nkwa onodu doro aru isonyere nke oma na ihe niile ana eme na otu ndorondoro ahu.

Na otu aka ahu ka onye ji okoloto otu ndorondoro yabu PDP azo okwa Governor State a na ntule aka ọchịchị afo 2027 bu Chief Uche Nnaji kwuputara ezi ohere doro aru nyere ndi a, ma kato ebubo oboro sina ọchịchị di ugbu a na State a amago afo na ala na nkwa okwere, gunyekwara oke utu isi, dika okpokuru ndi Enugu ka ha sonyere ya na mbo ya inaputa State a.

Onye ozo kwuru okwu ma buru onye welitere isi na PDP bu Basil Ani kowara mgbaghapu ndi a gbaghapuru NDC banye na PDP dika nkwalite ume otu ndorondoro a maka ntule aka ọchịchị afo 2027.

 


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited