Ochichi Soludo Agala Na Iru Megide Peter Obi Maka Ebubo Na Oji Ugwo Oge Ona Arapu Okwa Ochichi Anambra State

Written by on September 16, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ochichi Gov Charles Chukwuma Soludo na achi Anambra State agala na iru maa aka na iru megide onye ahu jiburu okwa Governor State ahu bu Mazi Peter Obi megide ihe yabu Obi kowara sina orapuru ego di ijeri Naira abuo na uma iri na ato na akpa ego ecological fund account State ahu oge ona apu na ochichi na afo 2014.

Na ozi onyefere ndi nta akuko taata bu Wednesday site na owa ozi ka Commissioner State ahu na ahu maka mgbasa ozi bu Dr Law Mefor kowara na akara oba ego First Bank Account Peter Obi kowara na orapuru yabu 2 point 13 Billion Naira abughi nke ecological fund account nyere ochichi State ahu.

Dr Mefor kowara na ochichi Anambra State enwetago mbiputa akporo certified printout yabu akara oba ego First Bank Peter Obi kporo aha ma choputa na obughi nke ecological fund account kama na obu nke internally generated revenue na nke consolidated revenue account, ebe ego ahutara na ya erughidi ka nke ahu Obi kporo aha ya.

Iga echeta na ochichi Gov Soludo noro nwanne unya bu Monday boo ebubo sina oka na akwu ugwo ochichi Peter Obi nakwa nke Willie Obiano ji na oge ochichi ha dika aka chiri State ahu na otu na otu.

Nke a kpatara mazi Peter Obi bu onye ji okoloto otu ndorondoro Nigeria Democratic Congress NDC azo okwa onye isi ala na ntule aka ochichi izugbe afo 2027 jiri noro unya bu Tuesday zaghachi ochichi State ahu ma kowa na orapuru ego kariri ijeri kwuru ijeri Naira na akpa ego govt Anambra State oge ona apu na ochichi na afo 2014.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited