Ndi Uwe Ojii Na Anambra State Anaputala Onye Atoro Na Ike Na Enugu State
Written by admin on September 15, 2026
by Chidimma Kama
Ndị uweoji ala anyị na Anambra State akwasala atụmatụ ndị ana enyo enyo na ha bụ ndị ntọrị ma zọpụta otu nwatakịrị gbara afọ ịrị na ịsịị enyere aha ya dịka Favour Ayogu, na Ekene Junction, n’ogologo Oguta Road, Onitsha, na State ahụ.
Ozi kọwara na eboro ebubo na atọrọ nwatakịrị ahụ na Igboeze South LGA nke Enugu State site n’aka otu ndị ntọrị, mana ha mechara gbaghapụ nwatakịrị ahụ n’oge ha ruru na akụkụ ebe ndị nchekwa nọ ọrụ nkwụsị na nyocha na Onitsha rie mbọmbọ ọsọ.
N’ozi pụtara ihe ụnya bụ Monday site n’aka onye mmekọrịta ọhaneze nyere habụ ndị uweojii na State ahụ bụ SP Tochukwu Ikenga, mere ka amata na azopụtara nwatakịrị ahụ site na njikọ aka n’ọrụ ndị ọrụ nchekwa rụrụ na abalị nwanne ụnya bụ ụka.
Yabụ onye Police Public Relations Officer PPRO mekwara ka amata na habụ ndị uweojii na-arịọ ọhaneze ọkachasị ndị bị na Igboeze South nakwa Ibagwa-Aka na Enugu State, bụ ndị nwere ozi ọbụla nwere ike inye aka chọta ezinụlọ nwatakịrị ahụ, ka onye dị etu ahụ ga n’ụlọ ọrụ ndị uweojii ọbụla dị ya nso ma ọbụ na Anambara State Police Command.
K’osila dị, Commissioner ndị uweojii na State ahụ bụ CP Nnanna Ama, toro ndị uweoji ahụ maka ezi ọrụ ha, dịka ọ gara n’iru riọ habụ ndị ọrụ nchekwa ka ha gba mbọ hụ na ha na anọ n’ebe ndị ahụ nwere ike inye aka kwasa atụmatụ ndị ekperima mgbe ọbụla ha nọ ọrụ nkwụsị na nyocha.
N’ikpeazụ ka habụ ndị uweojii kweghachịrị ụmụ afọ na State ahụ nakwa ndị ọbịa nkwa njikere ha dị iji hụ na enwere nchekwa zuru oke gara ndụ ndị mmadụ nakwa ihe ha nwere, hụ na ha n’aza okwu gbatagbata mgbe ọbụla akpọrọ ha ma chụọ ndị ekperima bụ ndị ihe ọma n’asa afọ ụkwụ eru ala na State ahụ.


