Ayra Starr abụrụla nwaanyị mbụ n’agu egwu n’ala anyị ndị kpọrọ egwu ya rugoro otu ijeri nke akpọrọ 1 billion viewers na ọwa ozi YouTube.
Written by Onyinye on May 27, 2025
Ayra Starr eturula ugo dịka nwa afọ ala anyị mbụ ndị kpọrọ ma gee afere egwu ya runugoro otu ijeri na ọwa ozi YouTube.
Ayra Starr agafela onye dịka Yemi Aládé bụbu onye oku egwu kacha wue ewu n’usoro ngụkọ ahụ.
Ndị nta akụkọ nwetara ozi na Ayra Starr gbara afọ iri abụọ na atọ jiri otu ijeri gafee Yemi Aládé bụ onye nọrọ na mbụ na enweta narị nde asatọ na ise ya bụ 805 million viewers.
Nwaanyị ahụ esonyerela ogbo ya ndị nwoke bụ ndị gụnyere Burna Boy, Flavour, Wizkid, Davido, Rema, Ckay, Kizz Daniel P_Sqaure, Omah Lay, Fireboy yana Tekno bụcha ụmụ afọ ala anyị ndị e kwuru na ndị kpọgoro egwu nke ha n’otu ọwa ozi YouTube ahụ bụ agụkata agba awaa.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.