Azoputala onye ukochukwu ahu atoro n’ odi nso a na mba South Africa.

Written by on April 16, 2025

Ndi ochichi mba South Africa emela ka amata na azoputala onye ukochukwu ahu sitere mba America bu onye nke atoro ubochi Thursday gara aga site n’ ebe ona aka uka ahu na mba ahu n’ agbanyeghi otutu mgbo egbe habu ndi ntori Zoro ka mmiribu nke dunara mmadu ato mmuo n’ Ike.

Yabu onye ukochukwu gbara afo iri ano na ise enyere aha ya dika Josh Sullivan ka ozi n’ akowa na ahutara ya na mpaghara Gqeberha Dina Eastern Cape na abali unya bu Tuesday n’ enweghi oko obula koro ya.

Ozi kowara na onwebeghi nkowa obula enwatara banyere habu ndi ntori bu ndi nke ana enyo enyo na ha mara ihe banyere ezi n’ ulo olu ahu.

Ndi uwe oji mba South Africa mere ka amata site na nguko ha, na ihe banyere ntori ejirigo percent nari abuo na iri isii na ano gbago na mba ahu kemgbe ihe kariri otu nari afo k’ odi ugbua.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited