Oke ngala onu ahia mba UK adala dika ha buturu onu ego mmanu ugboala ha.
Written by Onyinye on April 16, 2025
Oke ngala onu ahia n’ udi nwa bekee kporo Inflation Rate nke mba United Kingdom agbadatara karia ka aturu anya dika oji percent abuo na Uma isii data n’ ime onwa March afo a.
Ozi kowara na obu mbutu ebuturu onu mmanwu ugboala kpatara yabu Inflation Rate jiri gbatuo site na percent abuo na Uma asato odibu na ya n’ ime onwa February.
Nnyocha n’ egosikwa na yabu odida nwekwara Ike ibu nani nwobere oge dika ana atukwa anya na oka nwekwara Ike igbago ozo n’ ime onwa April ma elegara anya etu ugwo ana akugasi tinyekwara akuru ngwa ahia si agbago.
Ndi ulo aku mba England buru amuma na etu ihe si agara onu nwekwara Ike igbago ruo na percent ato na Uma asaa n’ ime afo a, ma norokwa Karia percent abuo dika aturu anya ya ganye n’ afo 2027 abia n’ isi njedebe.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.