Azoputala otu onye eze odinala na aka ndi ntori mmadu.
Written by Onyinye on June 4, 2025
Ndi uwe oji ala anyi na Nasarawa state azoputala onye eze odinala nke obodo Dari nke kokona local government area bu Emmanuel Omanji onye ndi ntori mmadu toro na obi eze ya na abali iri abuo na asaato nke onwa May.
Onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Nasarawa state bu SP Raman Nansel mere ka nke a puta ihe na Lafia bu isi obodo Nasarawa state unya bu Tuesday.
Sp Nansel mere ka amata na yabu onye eze odinala ka azoputara na aka ndi ntori mmadu ahu nwanne unya bu monday bu abali abuo nke onwa june oge okuru elekere iri n’ otu nke abali.
Yabu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe kowakwara na Omanji ka eduru gawa ulo ogwu ngwa ngwa anaputachara ya na aka ndi ntori Mmadu ahu, mana ugbua ka ejikogoro yana ezinaulo ya onu.
Onye commissioner ndi uwe oji ala anyi na Nasarawa state bu CP Shettima Jauro Mohammed nke onye nnochitere anya ya bu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na state ahu bu SP Raman Nansel toro oha obodo ahu maka inye ha ozi gbasara yabu onodu na oge.
Na ikpazu ka o kelere ndi nchekwa ndi ozo okachasi ndi vigilantes bu ndi ruru oru nke oma maka inaputa nwoke ahu na yabu aka ndi ntori Mmadu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.