Ndị omebe iwu ghọpụtara Jennifer Geerlings-Simons dika nwanyi mbu ga a bu onye isi ala na mba Suriname ụnya bu Sunday, dika otu ndọrọndọrọ ya nwetara nturu ugo na ntule aka ọchịchị emere n’ọnwa May. Yabu nwanyi dị afọ iri asaa na otu bu nanị onye ahapụrụ yabu oche onye isi ala dika onye ya […]

Ndị ndu otu BRICS nwere nzukọ na Rio de Janeiro ụnya bu Sunday ma dọọ aka na ntị na tarifụ mbubata onye isi ala US bu President Donald Trump, na-enweghị isi nwere ike imebi akụ na ụba mba ụwa. Ha kwupụtara nchegbu ha banyere ịrị elu nke tarifu nakwa usoro na-abụghị nke tarifụ bu nke […]

Otu ahu jikoro ndi Igbo na uwa niile bu Ohaneze Ndigbo Worldwide eburula ukpo ekene bugara North Carolina State nke mba United States of America maka iweputa abali iri na ano kwa onwa June afo niile dika ubochi ndi Igbo akporo Igbo Day na yabu State dina mba America. Ozi mere ka amata na aka […]

Ulo olu ala anyi ahu na ebu agha emegide inu ma obu itu mgbere ogwu gunyere anwuru ike akporo National Drug Law Enforcement Agency NDLEA ejichiela ogwu ike ruru otu nde kilogrammes na uma iri iteolu na ano na Abia State na ime otu afo. Yabu olu NDLEA gakwara na iru nwuchiko mmadu di nari […]

Aka ndi uwe oji ala anyi na Enugu State akpala umunwoke ano ana enyoenyo maka ebubo agwa ekperima ndi gunyere: igba izu ojo, iji egbe gaa ori, ijide ngwa ogu na uzo megidere iwu nakwa otu nzuzo. Nke a bu dika osiri di na mbo habu ndi uwe oji na agba ikpochapu ndi ahu jugoro […]

Otu onye ọrụ nke United Nations peacekeeper abụrụla onye e gburu site na nkusu nke ndị oji egbe mere na mba Central African Republic. Nwa amadi ahụ bụ nwa afọ mba Zambia ka UN kwuru na ọ bụ n’ụbọchị Friday nke izu gara aga ka e gburu ya site n’aka otu isi ekwe ọnwụ sitere […]

Ọtụtụ n’ime ndị na-azụ ahịa mmanụ ụgbọala n’ala anyị ebugola ọnụ ahịa nke ana ere otu ntụ lita fuel ihe ruru ugboro abụọ n’ime otu izu ụka. Ndị nta akụkọ nwetara ozi na ụfọdụ ọdụ mmanụ ụgbọala nke gụnyere Empire Energy filing station, Ranoil yana ọtụtụ ndị ọzọ na Abuja nọrọ n’izu gara aga kpatu […]

Nwa amadi ahụ jibu ọkwa coach nke otu Super Eagles ala anyị bụ Augustine Eguavoen ekwuola sị na ya bụ otu egwuregwu ka nwere ohere imecha tozua oké nke ndị ga-eso sọ iko mba ụwa ga ewere ọnọdụ n’afọ ọzọ bụ 2026. Nwoke ahụ gbara afọ iri ise na itoolu bụ ya weghara ọnọdụ ọkwa […]

Ndị uwe Kano State police command azọpụtala otu nwoke gbara afọ iri na itoolu bụ Ibrahim Abubakar bụ nwa afọ Adamawa state n’oge ọ rigoro elu ogige billboard dị mpaghara Ado Bayero bridge ma kwuo na chọrọ igbu onwe ya. Nwoke ahụ kwuru na ya ga-esi na ya bụ ebe matuo iji gbuo onwe ya […]

Otu nwata akwụkwọ mahadum Taraba State Polytechnic nọ n’afọ nke mbụ ya bụ Lorhee Saanmoyol Paul abụrụla onye nwetara onwe ya na ọnọdụ nke inwe ihe nkwarụ kworo maka ọkụ latric dọrọ ya nke mechara mee ka ebe ya aka ya abụọ. Ya bụ ihe ọdachi mere na Jalingo bụ isi obodo Taraba State n’abalị […]


Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited