News

Page: 3

Mahamoud Ali Youssouf nke mba Djibouti eturula ugo dịka onyeisi oche otu African Union commission. Youssouf turu ya bụ ugo ụnyaahụ bụ Saturday ka e mechara ya bụ ntụliaka ugboro ise zuru oke dịka o meriri ogbo ya sitere na mba Kenya bụ Odinga Odinga n’agba nke anọ. Nwa amadi ahụ ga e weghara ọkwa […]

Otu onye nkụzi nke ụka Islam gbara afọ iri abụọ na itoolu bụ Abdulrahman Bello abụrụla onye aka ndị uwe ojii na Kwara State kpara ụnyaahụ bụ Saturday maka ebubo na o gburu enyi ya nwaanyị nọ n’afọ nke ikpeazụ ya na ụlọ akwụkwọ Kwara State College of education bụ Yetunde Lawal. Bello ka e […]

Aka ndị uwe ojii Anambra State Police Command akpatala otu nwoke e nyere aha ya dịka Christian Ndubuisi maka ebubo na o ji mma were magbuo nwanne ya nwoke nke tọrọ ya n’oge ha na-enwe esemokwu. Ya bụ njinji bụ nke cp Ikioye Orutugu ji ọkwa Commissioner ndị uwe ojii na state ahụ kọwara dịka […]

Onyeisi ala mba United States bụ Donald Trump ekwuola sị na ọ ga-amasị ya inwe mkparịta ụka ga-adị n’etiti yana ogbo na-achị mba Russia bụ President Vladimir Putin yana nke mba China bụ President Xi Jinping banyere etu ha ga-esi maputa iwu ga egbochi ịga n’ihu na ị rụpụta ngwa agha ọ gwụrụ mba akpọrọ […]

Mba Thailand azọpụtala Imirikiti ndị mmadụ atụrụ mgbere dị narị abụọ na iri isii nke ọkara n’ime ha bụ ụmụ afọ mba Ethiopia sitere n’obodo Myanmar. Nkea sitere n’ọnụ ndị agha mba Thailand bụ ndị kwuru na ha amalitela ime oke ala obodo ha ka ọ bụrụ agaga. Ịtụ mgbere mmadụ abụrụla ndị na ewu […]

President Donald Trump na-achị mba United States anọrọla ụnyaahụ bụ Thursday were kwuo sị na ọ ga-amasị ya ka mba Russia lọghachi azụ n’otu group of seven nations bu otu mejupụtara mba ndị ahụ akụnụba ha bụ akwaa akwụru na mba ụwa niile. O kwuru na ọchụchu a chụpụrụ obodo Moscow n’otu ahụ adabaghi adaba. […]

Ọchịchị mba Ukraine ekwuola na ha agaghị anabata ụbụbọ udo ọbụla nke mba Russia yana United States n’akpa na-emeghi ka ha sonyere na ya. Nkea na-abịa dịka President Donald Trump nke mba United States yana ogbo nke mba Russia bụ Vladimir Putin kwechara nkwa sina ha ga amalite ịkpa etu udo ga-esi chịa eze ọzọ […]

Otu nwa afọ mba Afghanistan ana atụ anya na ọ bụ onye okpukperechi ụka Islam abụrụla onye anọrọ ụnyaahụ bụ Thursday kpụpụ n’ụlọ ikpe dị na mba Germany maka na o gburu mmadụ ibe ya ma chọọkwa igbu onye ọzọ n’otu ogige ebe ana eme ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị na mpaghara ndịda anyanwụ obodo Mannheim. Ikpe […]

Nwa afọ mba Brazil bụ nwaanyị ana ebo ebubo na o ji ọgwụ poison akpọrọ arsenic laced bu nke o tinyere na achịcha bekee bụ cake n’ụbọchị ekeresimesi chọọ ikpochapụ ndị ezinụlọ di ya abụrụla onye ahụrụ ka ọ tọgbọrọ n’ozu n’ụlọ mkpọrọ. Ebe ndị uwe ojii na atụ anya na nwaanyị ahụ ejirila aka […]

Otu nwa amadi jibu ọkwa nke National Auditor nyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC bụ George Moghalu agbatala akwụkwọ oji egosi mmasị o nwere isi n’otu Labour Party were zọọ ọkwa aka ga-achị Anambra Steeti n’ọnwa November na-abịa n’ọdịnihu. Ya bụ akwụkwọ ka e nyefere George Moghalu n’ogige Party Secretariat nke Labour Party dị na Abuja […]


Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies