Commissioner ndi uwe oji ala anyi na Anambra state eweputala usoro agu m akwukwo n’ efu gara umu akwukwo kasi Mee nke oma n’ ule WAEC.
Written by Onyinye on March 15, 2025
Commissioner ndi uwe oji ala anyi na Anambra state bu CP Ikioye Orutugu amaputala atumatu agu m akwukwo n’ efu n’ ogogo mahadum gara umu akwukwo ato kachasi mee nke oma na ule West African examination council WAEC bu nke ana akwadobe n’ odi n’ iru.
CP Orutugu gakwara n’ iru gbape atumatu nke eji ebu agha megide otu nzuzo nakwa Inu ogwu Ike n’ ulo akwukwo primary nakwa nke secondary nile enwere na Anambra state.
N’ okwu ya oge ona agwa umu akwukwo igwebuike secondary school di na Awka okwu, ka yabu commissioner noro me ka amata na ohere agu m akwukwo n’ efu a ana akwado ga agara obunadi onye Nne na Nna ya bu ogbenye ma obukwanu ogaranya, na ebu m n’ obi ya bu iji gba umu n’ eto eto ume ka ha gbadosie anya Ike n’ agu m akwukwo ha.
Ogakwara n’ iru nye umu akwukwo ahu ndumodu ka ha zere itinye aka n’ inu ogwu Ike m’ obukwanu sonyere n’ otu nzuzo kwere maka ihe okowara si, n’ ibanye n’ otu nzuzo n’ ebido n’ oge umu aka malitere Inu ogwu Ike.
N’ oge owuchiri n’ ogige ulo akwukwo St Patrick’s college Awka,ka nwa amadi nokwara duo umu akwukwo ahu odu,ka ha n’ erubere ndi nkuzi ha isi ma n’ egekwa ndi Nne na Nna ha nti.
CP Orutugu nokwara n’ otu aka ahu kpoputara habu umu akwukwo akara ekwe nti ya, ha ga akpo ma enwe ije agwo obula ha hutara na gburu gburu ha.
Na nke ya ka commissioner n’ ahu maka odinmma umu nwanyi nakwa umu aka na Anambra state bu odoziaku Ify obinabo noro rutu aka si na umuaka kwesiri ikpachafu anya n’ udi ndi ha na ha na anori.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.