Aka chiburu Rivers State bu Nyesom Wike ekwuola sina o gaghi abu ihe aru na achituru aka na-achi Rivers State ugbua bu Gov Siminalayi Fubara nokwa oru ya.

Written by on March 13, 2025

Aka chiburu Rivers State n’oge gara aga ma bụrụ onye nọ ka ọ dị ugbu a dịka minister n’ahụ isi ọchịchị ala anyị bụ FCT bụ Nyesom Wike ekwuola ya sina ọ gaghị abụ ihe arụ na achituru aka na-achị Rivers State ugbua bụ Gov Siminalayi Fubara nọkwa ọrụ ya.

N’okwu ya taa bụ Wednesday n’oge yana ndị nta akụkọ nwere mkparịta ụka ka Wike kwuru na e kwesịrị ichitu Gov Fubara nọkwa ya dịka aka na-achị state ma ọ bụrụ na achọpụta na o nwere iwu ọbụla ọ dara.

Onye minista ahụ gbaruru ihu etu ihe si aga ugbua na state Rivers ma kwuo mkpa ọ dị na ndị mmadụ gara n’ihu na erube isi na iwu nọkwa ọ bụla e nyere ha.

Nkea na-abịa ozugbo ọnụ na e kwuru ụlọ omebe iwu Rivers State House of Assembly bụ Martins Amaewhule nye chara Gov Siminalayi naanị mkpụrụ abalị abụọ ka ọ bịa chegharịa akwụkwọ ego mkpata na mmefu akpọrọ budget nke afọ 2025 azụ n’ihu ha.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited