Eric Chelle na elekọta otu egwuregwu Super Eagles ala anyị ahazighariala ndị otu egwuregwu ya maka asọmpi enyi na enyi ga-adị n’etiti ala anyị yana mba Russia.
Written by Onyinye on June 3, 2025
Onye nlekọta otu egwuregwu Super Eagles bụ Eric Chelle ahazighariala ndị otu egwuregwu maka asọmpi enyi na enyi nke ala anyị ga eji zụta mba Russia kworo maka ụfọdụ ndị otu egwuregwu ahụ merụrụ ahụ na ndị nke pụrụ apụ.
Ndị ahụ na agaghị e sonyere na asọmpi ahụ gụnyere Ọla Aina, Wilfred Ndidi, Samuel Chukwueze, Sadiq Umar, Kelechi Iheanacho yana Nethan Tella.
Wilfred Ndidi yana Umar Sadiq ka e kwuru na merụrụ ahụ ebe Ọla Aina, Samuel Chukwueze yana Kelechi Iheanacho rịọrọ ka ha gaa gboo mkpa metụtara ezinụlọ ha.
Nethan Tella n’aka nke ya ka e kwuru na o nweghị ike isonwu ha gaa mba Russia kworo maka na nkwekọrịta nke hana ha nwere akụrụla ọnụ.
Ha bụ ndị otu Super Eagles wuchigoro n’obodo Moscow nke dina mba Russia ụnyaahụ bụ Monday ga amalite ịdị njikere maka ya asọmpi taa bụ Tuesday.
Ya bụ asọmpi ga ewere ọnọdụ n’ụbọchị Friday na ama egwuregwu Luzhniki Stadium nke dị n’obodo Moscow.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.