George Moghalu agbatala akwụkwọ eji azọ ọkwa n’ala anyị akpọrọ nomination and expression of interest forms isi n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party zọọ ọkwa gọvanọ nke Anambra Steeti n’afọ a.

Written by on February 13, 2025

Otu nwa amadi jibu ọkwa nke National Auditor nyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC bụ George Moghalu agbatala akwụkwọ oji egosi mmasị o nwere isi n’otu Labour Party were zọọ ọkwa aka ga-achị Anambra Steeti n’ọnwa November na-abịa n’ọdịnihu.

Ya bụ akwụkwọ ka e nyefere George Moghalu n’ogige Party Secretariat nke Labour Party dị na Abuja site n’aka onyeisi oche nke Party ahụ bụ Julius Abure.

N’okwu ya ngwa ngwa enyefechara ya ya bụ akwụkwọ ka Moghalu kwupụtara olileanya ya imecha ghọọ aka na-achị Anambra Steeti site na ntụliaka ahụ.

Moghalu kwuru na mmasị ya nwere abụghị ọgụ na mgba maka na otu ihe doro ya anya bụ na e mechaa n’ikpeazụ na ọ bụ otu onye n’ime ha ga-eji ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ Labour Party were zọọ ya bụ ọkwa mana ya nwere olileanya na onye ahụ ga-abụ ya onwe ya.

O kwuru na ya amalitela ọsọ nke iji ntụliaka weghara ọkwa ọchịchị nke state ahụ n’aka Gov Chukwuma Soludo na-achị state ahụ ka ọ dị ugbu a.

Na mgbe a jụrụ nwa amadi ahụ jibu ọkwa managing director nke national inland waterways authority ihe kpaliri mmụọ ya ka o kwuru na ya mere mkpebi ahụ mgbe ya kpotuchara ndị ọnụ na eru n’okwu.

N’aka nke ya ka Julius Abure kelere George Moghalu maka inwe ntụkwasị obi n’ebe otu Labour Party nọ ma kwee nkwa na ha ga-eji nkwụba aka ọtọ were mee ntụliaka ime ụlọ ha iji mara onye ha ga enye ọkọlọtọ ha iji zọro ha ya bụ ọkwa nke gọvanọ Anambra Steeti ga ewere n’ọnwa Nov nke afọ a.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies