Gọọmenti mba South Africa ekwupụtala nwụchi nke ha nwụchiri Anabela Rungo bụ nne nke nwada ahụ tuburu ugo dịka nwaanyị kacha maa mma n’ala anyị akpọrọ Miss Universe Nigeria bụ Chidimma Adetshina.
Written by admin on February 17, 2025
Gọọmenti mba South Africa ekwupụtala nwụchi nke ha nwụchiri Anabela Rungo bụ nne nke nwada ahụ tuburu ugo dịka nwaanyị kacha maa mma n’ala anyị akpọrọ Miss Universe Nigeria bụ Chidimma Adetshina.
Ana ebo nne nwaanyị ahụ ebubo iji ụzọ aghụghọ nweta akwụkwọ ikike njirimara nwa afọ mba South Africa.
Ha kwuru na ha nwetara ya bụ akwụkwọ adigboroja ụnyaahụ bụ Saturday site na nnyocha nke ụlọrụ Home Affairs investigators hana ogbo ha ndị uwe ojii na mba South Africa jikọrọ aka ọnụ were mee n’ụlọ nwaanyị ahụ.
Anabela Rungo bụ nwa afọ mba Mozambique ka a nwụchiri n’ebe nzuzo ya dị n’obodo Cape Town ụnyaahụ bu Saturday.
Nwaanyị ahụ ka anọrọ na ọnwa Seputemba nke afọ gara aga bụ 2024 were kpọọ persona non grata nke pụtara onye ana anabataghị n’obodo ahụ.
Ịga echeta na ada ya nwaanyị bụ Chidimma Adetshina nọrọ n’oge ihe ejije ahụ wezụga onwe ya na ọsọ nke Miss South Africa pageant kworo maka esemokwu metụtara obodo o si na ya yana ebubo nke na nne ya jiri ụzọ aghụghọ nweta akwụkwọ ikike njirimara nwa afọ South Africa.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.