Government etiti ekwuputala ụbọchị Friday abalị isii nakwa Monday abalị itoolu n’ọnwa June nke afọ a dika ụbọchị ezumike.
Written by Onyinye on June 2, 2025
Government etiti ekwuputala ụbọchị Friday abalị isii nakwa Monday abalị itoolu n’ọnwa June afọ a bu 2025 dika ụbọchị ezumike yabu public holiday iji merube mmemme Edi-ul-Adha nke afọ a.
N’ozi putara ihe taata bu Monday na Abuja site n’aka onye Permanent Secretary nke ụlọ ọrụ Ministry of Interior bu Dr. Magdalene Ajani, kwuputara na ọbu Minister, Dr. Olubunmi Tunji-Ojo mere ka nkea puta ihe n’aha government etiti.
Onye Minister ahụ kenere ndị okpukpere ụka Muslim, ma ndị nọọ na ala anyi a bu Nigeria ma ndi nọ na mpaghara mba ụwa dị iche iche maka ya bu mmemme.
Ọ kpọkpuru ndị ndu Muslim ka ha gba mbọ na agbasara mmụọ onyinye nakwa okwukwe dika Prophet Ibrahim siri mepụta ya na omume, ma jirikwa oge mmemme a kpe ekpere maka ọdị mma nke ala anyi bu Nigeria.
Onye Minister ahụ gara n’iru kwe ụmụ afọ Nigeria nkwa na atụmatụ nke Renewed Hope Agenda onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu ji n’aka bu iji weghachite ala anyi bu Nigeria n’ogogo ka mma.
Dika ọ gara n’iru riọ ụmụ afọ Nigeria ka ha soro ọchịchị dị ugbua jikọ aka ọnụ iji weghachite otito nke ala anyi bu Nigeria dika mba aga eji n’ama atụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.