Govt Enugu State akatola ya na ebe odi ukwuu bu ebubo ajo akparama agwa nke onye isi oche Nsukka LGA kpara

Written by on February 25, 2025

Govt Enugu State akatola ya na ebe odi ukwuu bu ebubo ajo akparama agwa nke onye isi oche Nsukka LGA jiri manye onwe ya na ikikere diara naani govt State a site na ulo olu ministry na ahu maka okpuru ochichi ime obodo, mmepe imime nakwa echimechi.

Mgbaru iru megide yabu akparama agwa ojo putara ihe na isi obodo Enugu site na ozi Commissioner State a na ahu maka okpuru ochichi ime obodo, mmepe imime obodo nakwa echimechi bu Deacon Okey Ogbodo nyefere ndi nta akuko megide etu onye isi oche Nsukka LGA siri manye onwe ya itisa udo ohaneze na ime obodo Umuoyo-Nru Community nke yabu Nsukka LGA dika osiri metuta ntule aka ochichi ejiri roputa onye eze odinala ohuru obodo ahu.

Deacon Ogbodo gwara ndi nta akuko na agbasoro usoro iwu chikoba ntule aka ochichi ejiri roputa Chief Dr Ejike Asadu na okwa eze odinala obodo ahu na abali asato nke onwa a bu February, afo 2025 mana onye isi oche Nsukka LGA bu Hon Jude Asogwa biara manye onwe ya site na idegara onye President General obodo ahu ozi ederede nkato nwere ike ibute ogbaghara megide yabu ntule aka ochichi.

Yabu Commissioner nyere nkowa sina ihe banyere nhazi, nlekota, nchikwa nakwa mkpokota obodo niile enwere na State a bu naani na aka govt State site na ulo olu ministry na ahu maka okpuru ochichi ime obodo, mmepe imime obodo nakwa echimechi ka odi na aka.

Okowara na obukwu yabu ulo olu ka ihe banyere nlekota nakwa mgbaziri okpuru ochichi ime obodo iri na asaa enwere na State a dina aka.

Deacon Okey Ogbodo gwara ndi nta akuko na mpaghara ya nke Cap 151, Part 4, Section 27 (1&2) nke iwu Enugu State Traditional Rulers Law mere ya ka odo anya nke oma na ikikere nroputa ma obu mkpolite na okwa eze odinala na obodo niile enwere na State a gunyekwara ihe obuna bu nghotahe daputara na ya bu naani na aka yabu Commissioner ulo olu ministry ka odi.

Na oge ona akowa mmanye ahu onye isi oche Nsukka LGA manyere onwe ya na ihe di naani na aka govt State a dika osiri metuta yabu ntule aka ochichi ejiri roputa onye eze odinala obodo Umuoyo-Nru Community dika nke na ekwesi ekwesi ka Deacon Ogbodo mere ka amata na agwa di etu bu ima aka na iru megide ikikere ochichi Enugu State nakwa itisa ezi mbo udo na nchekwa aka na achi State a bu Gov Peter Ndubuisi Mbah na agba.

Oyoziri ohaneze okachasi ndi obodo yabu Umuoyo-Nru Community ka ha ghara ige nti na ozi ederede nkato ahu sitere na aka onye isi oche Nsukka LGA ebe okowagoro yabu ozi dika nke na enweghi isi na odu.

Na ikpeazu ka Commissioner a yoro ndi nchikwa okpuru ochichi ime obodo niile dina State a ka ha gbado anya naani na olu nke ahu bu nke iwu nyere ha ikikere ma rapu nke na adighi na ikikere ha.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited