Mba England agbapela atumatu inye ndi mmadu ogwu ngbochi oria gonoria.
Written by Onyinye on May 21, 2025
Mba England k’ ozi n’ akowa na ha ga Abu mba mbu n’ uwa nile ga amalite inye ndi mmadu ogwu ngbochi oria gonoria bu oria abute site na mmeko nwoke na nwanyi.
Yabu ogwu ka ana akowa na obughi make onye obula kama na ha ga ebu uzo lebara anya na ndi umu nwoke na anu nwoke ibe ha bu ndi nke n’ enwe mmeko gara otutu ndi mmadu, ma obukwanu ndi nke nwetagoro nje STI.
Yabu ogwu ngbochi ka ana akowakwa na oga eji ihe dika percent iri ato ruo na iri ano gbochie yabu oria, kama ulo olu aru Ike mba England nwere olile anya na nkea ga ebeleta otutu onu ogugu ndi bu yabu nje.
Ozi kowara na aga amalite iga yabu ogwu ngbochi n’ onwa August n’ ulo aru Ike digasi iche iche.
Ndi olu aru Ike mba Scotland mekwara ka amata na ha kana agba mbo igbape atumatu nke ha n’ oge n’ adighi anya iji zota ndu ndi nwere nje a.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.