Mba Israel abawanyela agha mwakpo ha gara mpaghara Gaza’s strip nke mba Palestine.
Written by Onyinye on May 14, 2025
Ndi agha mba Israel abawanyego agha mwakpo ha gara mpaghara Gaza’s strip nke mba Palestine dika ha noro n’ ime abali unya gbuo opekata mpe ya buru mmadu iri isii na ise tinyekwara mmadu iri ano na ise ha gburu na mpaghara north Gaza.
Mba Russia,China nakwa UK ajula inabata atumatu ahu mba US nakwa Israel jiri cho ikesa akurungwa enye m aka gara mpaghara Gaza,kama ka ha n’ ario ka mba Israel kagbuo agha mwakpo onwa abuo ahu ha akwadoro mpaghara Gaza.
Aka n’ achi mba America bu president Donald Trump bu onye nke n’ emegara mba Saudi Arabia njem nkpoturu emela ka amata, na ya n’ agbasi mbo Ike iweta ogbaghara ahu n’ ada n’ etiti mba Israel nakwa Gaza’s strip n’ isi njedebe, kama na prime minister mba Israel bu Benjamin Natanyahu mere ka amata na onweghi ihe ga eme ka ha kwusi yabu agha.
Ndi olu aru Ike mpaghara Gaza wetara ozi,na umu afo mba Palestine egbugoro egbu site agha ahu di opekata mpe mmadu di puku iri ise na abuo na nari itolu na asato ebe ndi nwetara ihe mmeru aru di otu nari puku na iri itolu,nari asaa na iri abuo na otu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.