Ndi ahia na Onitsha nke dina Anambra State amalitela ihusi anya dika e mechiri kpamkpam mpaghara ahia isii na ya bu ahia.
Written by admin on February 20, 2025
Ndị ahịa na Onitsha nke dina Anambra Steeti amalitela ịhụsi anya dịka e mechiri kpamkpam mpaghara ahịa isii na ya bụ ahịa site n’aka ndị ọrụ nchekwa ihe rugoro izu abụọ ka ọ dị ugbu a.
Ndị nta akụkọ nwetara ozi na ọtụtụ ụlọ ahịa ka e mechiri emechi site n’aka ndị ọrụ nche bụ ndị kwuru na ahụrụ ọgwụ na akọrọ ngwa adigboroja na ya bụ ebe.
Mpaghara ya bụ ihe kacha metụta gụnyere ahịa Onitsha Drug market amara dịka ọgbọ ọgwụ, Oduwani power tools and allied market, surgical line market, plumbing materials market, Ogbogwu fashion market, bridge head provision market, yana ụfọdụ mpaghara nke ahịa osisi bụ timber dealers market.
Nkea na-abịa dịka ozi kwuru na ụlọrụ NAFDAC kpọtuchara ndị agha ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka iji belata etu ọgwụ adigboroja na nke mebigoro emebi si arị ibe ya elu na ya bụ ahịa.
Ụfọdụ ndị ahịa gwara ndị nta akụkọ okwu na mpaghara head bridge kwara arịrị n’ihe ha kwuru sị na ndị ọrụ nke gọọmenti egbochiela ụmụ afọ ala anyị ime ihe ndị ahụ ha ji arachaa piom bụ nke iwu kwadoro.
Ha katokwara usoro ụlọrụ nafdac si agbaso ya bụ amụma nke ibu agha megide ọgwụ n’ihe oriri adigboroja.
Otu onye gwara ndị nta akụkọ okwu n’oge ahụ bụ Michael Okoh kwara arịrị si na ha ahụsiela anya kworo maka na o nweghị mgbe a gwara ha jikere na udiri ihe a na-abịa ime.
Ndị ahịa ahụ toro gọọmenti na mbọ ọ n’agba iji chụọ akọrọ ngwa adigboroja na nke mebigoro emebi ọsọ ụkwụ eru ala mana ha rịọrọ ka e mee ihe ọbụla ngwa ngwa ka agụụ ghara ịtọpu ụmụ mmadụ ọgọdọ n’ukwu.