Ndị oji egbe ana amaghị egbuola otu nwoke gbara afọ iri asatọ na anọ na Anambra State.

Written by on March 12, 2025

Ndị oji egbe ana amaghị egbuola otu nwoke gbara afọ iri asatọ na anọ bụ onye ndu obodo Umudioka nke council ime obodo Awka South na Anambra Steeti bụ Ichie Michael Nwobu.

Ndị nta akụkọ nwetara ozi na Ichie Nwobu ka e gburu n’ime ụlọ ndina ya n’ụtụtụ ụbọchị ụka n’oge ndị ezinụlọ ya gachagoro ụka.

Ozi kwuru na ọ fọrọ obere ihe ka ndị ntorobịa obodo ahụ iwe dị n’obi mụnye ọkụ na ya bụ obodo Umudioka mana site na enyemaka ndị okenye ka e mechara si mee ka iwe ha dajụọ.

Onwebeghi ozi e nwetara banyere ihe ọbụ ya kpatara ogbugbu nke onye okenye ahụ mana ndị ezinụlọ tinyere ikwu na ibe kwuru na nkea bụ nke mbụ udiri ihe ahụ na-eme n’obodo ha.

Na mgbe ndị nta akụkọ kpọturu SP Tochuckwu Ikenga bụ onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uwe ojii na Anambra Steeti ka o kwuru na ya bụ erubeghị ha ntị n’oge ndekọ akụkọ ụwa anyị.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited