Ndị ọrụ nchekwa emela ka amata na ọtụtụ ndị mmadụ zutara ọnwụ ha n’ike site na mwakpo eme na mba Democratic Republic of Congo.

Written by on July 28, 2025

Ndị ọrụ nchekwa emela ka amata na ọtụtụ ndị mmadụ zụtara ọnwụ ha n’ike site na mwakpo otu ndị Islamic State mere na ugwu ọwụwa anyanwụ nke mba Democratic Republic of Congo.

N’ime mmadụ iri abuo ahụ zutara ọnwụ ha n’ike bu ndi okpukpere chi uka Christ bukwanụ ndị sonyere na ekpere imụ anya abalị n’ụlọ uka dị na Komanda n’oge otu Allied Democratic Forces ADF wakporo ha n’ike, dika ha munyekwara ụlọ ahịa dịcha n’akuku ebe ahụ ọkụ.

Otu ADF bu otu malitere na mba Uganda na afọ 1990s, dika ha na ebo government ebubo na ha na egbu ndị okpukpere chi Muslims, mana ugbu a ha dabere na okeala DR Congo, ebe ha na-awakpo ndị nkịtị nke okpukpere niile, ya nakwa mba Uganda.

Dieudonne Duranthabo, bu otu onye nhazi obodo na Komanda gwara ndị nta akụkọ na enwere ike ịchọta ozu ndị ọzọ dika ha mechara mwakpo ahụ.

Onye ukochukwu na elekota ụlọ uka ahụ bu Fr. Aime Lokana Dhego, gwara ndị nta akụkọ na opekata mpe mmadụ iri atọ na otu sitere Eucharistic Crusade movement zụtara ọnwụ n’ike, mmadụ ịsịị nwetara ihe mmerụ ahụ n’ebe ọdị ukwu, ebe atọrọ ụmụ na eto-eto dika ọ ka nwebeghi ozi ha nụrụ banyere ha.

N’afọ 2021 mba Democratic Republic of Congo kpọrọ ndị agha mba Uganda ka ha bịa nyere ha aka buo agha megide mwakpo otu ADF na eme ha, mana yabu mwakpo ka na eko achicha n’ebe ọdị ukwu.

Komanda dị na mpaghara Ituri na DR Congo bu ndi nwere akụ ime ala, dika ọtụtụ otu dị iche iche na ebu agha emegide ha kemgbe ọtụtụ afọ k’ọdị ugbua.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited