Ndị ụlọ ọrụ NEMA emela ka amata ndị ọdachi ide mmiri metụtara na afọ 2024 na Enugu State.
Written by Onyinye on May 30, 2025
Ndị ụlọ ọrụ National Emergency Management NEMA, kwuputara na opekata mpe ihe ruru mmadụ iri abụọ na ise zụtara ọnwụ ha, mmadụ otu narị na iri isii na isii nwetara ihe merụ ahụ, ebe ezinụlọ puku itoolu na narị atọ na iri ise na abụọ bu ndi ọdachi ide mmiri metụtara na afọ 2024 na State a.
Onye Director General nke ụlọ ọrụ NEMA bu Odoziaku Zubaida Umar, mere ka nkea puta ihe ụnya bu Wednesday n’oge ndị stakeholders nwere nkaparita ụka gbasara National Disaster Preparedness and Response Campaign NPRC nke afọ a bu 2025.
Onye nọchitere anya Odoziaku Umaru bu onye Director na ụlọ ọrụ NEMA bu Dr. Evans Ugoh, mere ka amata na achọpụtara na mmadụ puku iri ise na ise, narị itoolu na anọ, nakwa ezinụlọ puku atọ na otu ka ọdachi ide mmiri ahụ metụtara n’ime afọ 2024 na State a, ebe ihe ndị a niile butere ihe nfunari gara ọtụtụ obodo, ezinaụlọ nakwa ndị mmadụ n’otu n’otu.
Onye Director General ahụ kọwara na ihe kpatara ejiri chikọba mkparitauka ahụ bu iji gwa government state a, okpuru ọchịchị ime obodo nakwa emergency management stakeholders gbasara ọdachi ide mmiri nke afọ a bu 2025.
Dika o mere ka amata na ndị kwupụtara maka yabu ọdachi ide mmiri nke afọ a bu 2025, gụnyere ụlọ ọrụ Nigerian Meteorological Agency NIMET nakwa ụlọ ọrụ Nigeria Hydrological Services Agency.
Na nzaghachi ya ka onye Director nke ụlọ ọrụ Enugu State Emergency Management Agency SEMA bu Odoziaku Chinasa Mbah, kwupụtara na ụlọ ọrụ SEMA edegarala ndị isi oche okpuru ọchịchị ime obodo iri na asaa enwere na State a ozi gbasara yabu ọdachi ide mmiri nakwa ihe ana atụanya ka ha mee.
Mbah mekwara ka amata na ụlọ ọrụ ahụ eweputala atụmatụ iji nye ogbugbo gara ụzọ mmiri na agafe na obodo ndị ahụ ọdachi a nwere ike ịmetụta.
Onye Commandant of Nigerian Security and Civil Defence Corps NSCDC na Enugu State Command bu Dr. Elijah Willie, kwere nkwa na ndi ọrụ ya dị njikere iza okwu mgbe ọbula enwere ọnọdụ gbatagbata dika ndị ọrụ izizi nọdebere ohaneze nso.
Onye nọchitere anya Willie bu onye Deputy Corps Commandant bu Mazi Victor Duruegbesonu, kwuru na ụlọ ọrụ NEMA, nke SEMA nakwa ndị nwere ihe ọdachi nwere ike ikpọturu ndị ọrụ ha na local government nakwa divisional office maka inweta enyemaka ọsịsọ.
Nwa amadi ahụ bu State Coordinator of Local Emergency Management Committee LEMC bu Mazi Emeka Oko, kenere ụlọ ọrụ NEMA, SEMA, Nigerian Red Cross Society, Federal Fire Service nakwa ụlọ ọrụ nchekwa ndị ọzọ n’ebe ọdị ukwu maka nkwado ha na enye otu ya iji rụo ọrụ ha nke ọma.
N’okwụ gbasara ọdachi ide mmiri ahụ ka onye Director General nke ụlọ ọrụ NEMA rịọrọ ndị Amechi Idodo community dị na Nkanu East LGA ka ha gba mbọ na edebe gburugburu ha ọcha ma hụ na ụzọ mmiri na agafe yecha oye.
Na nzaghachi ya ka onye eze ọdinani na elekọta obodo ahụ bu His Royal Highness, Igwe Hyacinth Edeani, kwere nkwa na obodo ya ga agba mbọ gbasoro ntụziaka ụlọ ọrụ NEMA nyere ha maka ọdị mma ha.
Igwe Edeani ma burukwa onye isi oche nke Council of Traditional Rulers na Nkanu East LGA, kwere nkwa na oge agba mbọ hụ na otu Community Flood Response Committee ndị ụlọ ọrụ NEMA guzobere ga enweta ezi ntụziaka iji rụo ọrụ ha nke ọma gbasara ọdachi idei mmiri.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.