Ndi uwe oji ala anyi ekposala ngalaba ha nke Special Weapon and Tactical Squad ma guzobe nke ha jiri dochie anya ya.
Written by Onyinye on March 22, 2025
Ndi uwe ojii ala anyi ekposala ngalaba ha nke Special Weapons and Tactical Unit gunyekwara nke Special Squad.
Na iji dochie anya ya, ha eguzobela unit nke akporo Scorpion Squad.
Obu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Abia state bu Odoziaku Maureen Chinaka site n’ ozi onyefere ndi nta akuko.
N’ ozia, ka Commissioner ndi uwe oji ala anyi na Abia state bu CP Danladi Isa noro gba habu otu Squad eguzobere ohuru mkpa o di igbado anya n’ olu ha ma ruputa ihe aturu anya.
O gakwara n’ iru nye ntuziaka etu aga esi hazie yabu olu iji mita ezi mkpuru . gbakwunyere na ndi olu uwe ojii kwesiri ide na agbasoro usoro iwu ndi ahu n’ achikwa ha, tinyekwara idi n’ eyi Akwa ejiri mara ha maka iza ajuju.
Yabu onye CP gakwara n’ iru gwa ha ka ha buo agha megide agwa ojoo a na ahuta na Abia State iji huu na agwa mpu a belatara.