Ndi uwe oji ala anyi na Enugu state anwuchiela ndi ana enyo enyo na habu ndi ori na state a.
Written by Onyinye on August 25, 2025
Ndi uwe oji ala anyi na Enugu State anwuchiela mmadu asaato ana enyo enyo na ha bu ndi ori, ma naputa ha ugbala asaato ha ziri na ori.
Habu ndi uwe oji ala anyi na state a gakwara na iru kwuputa na nke bu kwere maka enyocha kpu oku na onu nke ha bidoro na abali asaato nke onwa August wee ruo na abali iri abuo na otu nke onwa a anyi noo na ime ya na mpaghara digasi ichiche nke state a.
Kosiladi, ha mekwara ka amata ha naputakwara habu ndi ori ihe ndi ozo gunyere ogba tum tum, akara ugbala bu plate number digasi ichiche tinyekwara otutu igodo ugbala na oge enyocha ahu.
Nke a putara ihe site na ozi onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na state a bu SP Daniel Ndukwe nyefere ndi nta akuko nwanne unya bu Friday.
Habu ndi ori ahu anwuchiri gunyere: Eze Obinna gbara naani afo iri ano na ano, Jideofor Igwumba gbara afo iri ato na ise, Martin Okwor Ada gbara afo iri ano na iteolu, Chigozie Ebisike gbara naani afo iri ano na abuo tinyerekwara mmadu ano ndi ozo.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.