Ndi uwe oji ala anyi na Enugu state nke ejikotara ha na ngalaba Thinkers Corner Division ejikola aka onu ha na ndi neighborhood watch wee nwuchiko otu nwokorobia ana enyo enyo na obu onye ori.
Written by Onyinye on June 4, 2025
Ndi uwe oji ala anyi na Enugu state nke ejikotara ha na ngalaba Thinkers Corner Division ejikola aka onu ha na ndi neighborhood watch wee nwuchiko otu nwokorobia ana enyo enyo na obu onye ori gbara naani afo iri abuo enyere aha ya dika Nwachukwu Chukwuma na abali mbu nke onwu june nke afo anyi no na ime ya, na oge ojiri okara gafe elekere iri na otu nke abali.
Onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Enugu state bu SP Daniel Ndukwe mere ka nke a puta ihe na okwu ogwara ndi nta akuko unya bu Tuesday na Enugu state, dika okowara na anwuchiri yabu nwokorobia oge ona agaghari na ogige thinkers corner na Enugu state.
SP Ndukwe kowakwara na enyocha emegoro yabu nwokorobia ka achoputara otu egbe pistol na aka ya nke etinyere otu mgbo egbe di ndu na ya
Yabu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji mekwara ka amata na nyocha ka na aganihu amata ihe mere oji wee na ezi ohi
Na ikpazu ka SP Ndukwe gwara ndi nta akuko na onye commissioner ndi uwe oji ala anyi na Enugu bu CP Mamman Bitrus Giwa nyela iwu ka esie imi nyocha na ala choputa ndi nille hana ya na ezi yabu ori ma nwuchiko ha ma nara ha ngwa ogu nke foro ha na aka.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.