NDI UWE OJI EMELA MKPOCHA NA NZACHA MEGIDE NDI ISI EKWE ONWU NA ENUGU STATE MAKA MMEME CHRISTMAS, AFO OHURU

Written by on December 12, 2024

Ndi uwe oji ala anyi na Enugu State ebuola agha di egwu buso ndi ekperima putara imekpa ndi mmadu aru na oge mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru na akpudobe nso dika habu ndi uwe oji sitere na ibu agha a nwuchikoro umunwoke abuo ana enyoenyo maka iji egbe aga ori na State a.

Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi taata bu Thursday ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Enugu State bu DSP Daniel Ndukwe mere ka amata na obu ndi uwe oji sitere mpaghara Abakpa Police Division nke isi obodo Enugu buru uzo noro kemgbe abali iri abuo na abuo nke onwa November gara aga site na enyemaka ndi nche Neighborhood Watch nwuchiko otu nwokorobia gbara afo iri abuo na iteolu enyere aha ya dika Daniel Aniude nke bina No. 27, Isiekenise Street dina Abakpa Nike nke yabu isi obodo Enugu maka ebubo iji egbe gaa ikapu otu nwaanyi ihe ya na ike.

DSP Ndukwe koro ngalaba akuko uwa anyi na ngalaba Anti-Robbery Squad nke alaka State Criminal Investigations Department SCID habu ndi uwe oji mere nnyocha ma kpuga yabu Daniel Aniude ulo ikpe buzi ebe anoro nye iwu ka aga kpochie ya na ulo nga Nigerian Correctional Custodial Centre dina isi obodo Enugu.

Na aka nke ozo ka ndi uwe oji sitere mpaghara Nkanu East Police Division sitere na njiko aka na olu ndi nche Neighborhood Watch nakwa vigilante nwuchikoo otu nwokorobia gbara afo iri abuo na ise enyere aha ya dika Uzor David ma buru nwa afo obodo Isu nke Onicha LGA na Ebonyi State kwere maka ebubo na oji egbe napu mmadu ogbatumtum ukwu ato tricycle amakariri dika keke na obodo Nara Unateze nke Nkanu East LGA.

Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Enugu State kowara na Uzor David sitere na mpaghara Holy Ghost nke isi obodo Enugu kpota onye Keke ahu ka obuga ya Nara, mana onoro ngwangwa ha ruru obodo Nara jiri egbe locally fabricated pistol gbajuo onye Keke ahu aka ma napu ya Keke ya na ike.

Ka osiladi ndi nchekwa mere ngwangwa nye nwa amadi ahu oso ma jichie, naputa ya yabu Keke gunyere egbe ahu oji akpa ike ojo ya.

DSP Daniel Ndukwe kwuputara na ndi uwe nke mpaghara Emene Police Division sitere na enyemaka ndi nche Neighborhood Watch noro na abali isii nke onwa a bu December tisa atumatu ojo ndi oji egbe eri jiri cho iga ori na mpaghara Upper Rehab dina Emene, ebe anaputara otu egbe locally fabricated pistol nakwa mgbo ya agbapugoro agbapu na aka ndi ekperima ahu mechara ria mbombo oso.

Ndi uwe oji ala anyi na State a gakwara na iru noro na abali abuo nke onwa a tisa atumatu ojo ozo ndi ekperima jiri cho iji egbe gaa ori na mpaghara College road nke Abakpa Nike.

Nwa amadi a ji okwa onu na ekwuru ndi uwe oji ala anyi na State a kowara ngalaba akuko uwa anyi na ndi uwe ozo noro na abali isii nke onwa a site na ozi mgbaama gaa naputa otu egbe Beretta pistol ekechiri na akpa awunyere garri na mpaghara Abakpa Junction Bus Stop nke isi obodo Enugu.

Na ikpeazu ka yabu onye PPRO kowara na Commissioner ndi uwe oji ala anyi na Enugu State bu CP Kanayo Uzuegbu ekwunwuola uchu ya ihuna akwara ndi ekperima nkwa ojo na State a na oge mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru gunyere ma emecha habu mmeme, dika oyoro ohaneze ndi State a ka ha na adonyere ndi uwe oji ukwu site na idi na ewetara ha ozi di mkpa megide ije agwo na okirikiri ha ma murukwa anya na nche oge niile gunyekwara idi na erube isi na iwu.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies