Ndị uwe ojii ewegharala ọnọdụ na esemokwu dapụtara n’etiti ụlọrụ na egwuputa mmanụ agbidi n’ala yana ụmụ afọ obodo Ohaji Egbema nke dina Imo State.

Written by on March 19, 2025

Ndị uwe ojii na Imo State nke onyeisi ha bụ CP Aboki Danjuma azọbanyela ụkwụ ha na esemokwu ahụ malitere ịrị ibe ya elu n’etiti ụlọrụ Sterling Global yana ụmụ afọ obodo Obitti nke dina council ime obodo Ohaji Egbema nke dina Imo State.

Esemokwu malitere ozugbo ndị ntorobịa nke ime obodo ahụ nuputachara n’igwe mee ngagharị iwe nke ha jiri ụzọ udo were mee iji were megide ụlọrụ ahụ maka ebubo ha boro sị na eleghara obodo ha anya n’ọtụtụ ụzọ tinyere otu onye ndu ha aka ji eji bụ Eugene Nwamgbo.

Ngagharị iwe ahụ bụ nke emere site n’aha otu akpọrọ Obitti liberation council bụ ndị kwuru na ụlọrụ ahụ agbahapụla oke na ọrụ dịrị ileta obodo ha nọ na ya anya etu o siri kwesị ekwesị.

Onye ndu nke ndị ahụ mere ya bụ ngagharị iwe bụkwa onye ji ọkwa nke Vice president nyere ya bụ otu Obitti liberation council bụ Nzubechi Godswill Ossai kwuru n’ihe kpaliri ha ime ya bụ ngagharị iwe bụ kworo maka otu n’ime onye ndu ha bụ Eugene Nwamgbo onye o kwuru na anwụchiri na Abuja oge o sonyere ndị ọzọ were nwee ọgbakọ akpọrọ ha oku ya na Abuja.

Ossai kwuru na ọ bụrụla agwa ndị ụlọrụ mmanụ iji aka ike were na èso obodo ọbụla há nọ n’ime ya.

O mechara nye ụlọrụ ndị ahụ ndụmọdụ ka ha jiri nwayọọ na eso nwe obodo ha nọ n’ime ya tinyere ịdị na etinye ndị ntorobịa n’ihe ana eme ya nakwa igbo nsogbu nke mmanụ imebisi ala ha akpọrọ oil spillage.

N’aka nke ha ka odeakwụkwọ nyere ụlọrụ ahụ bụ Iheanyi Ohaji kwuru na o nweghị mgbe ọ bụ ebumnuche ha ịbịa mepee obodo ahụ na naanị ihe ha kwesịrị ime bụ ịgbanwe anwụrụ ọkụ akpọrọ gas emission nke na-esi n’ụlọ ọrụ ahụ na-apụ ka ọ ghọọ ọkụ latric nyere obodo ahụ niile.

Mana ndị ahụ ha nọ n’obodo ha eburula iro n’obi were na emeso ha.

N’okwu nke ya ka onye Commissioner ndị uwe ojii bụ CP Aboki Dajuma n’oge o zutere ndị ndu obodo ahụ yana ndị nlekọta nke ya bụ ụlọrụ Sterling Global ka ha tinye mma ha n’obo ma hụ na udo chịrị eze ọzọ.

Ọ gwara ụlọrụ ahụ mkpa ọ dị ịhụ na ha rubere isi n’akwụkwọ nkwekọrịta memorandum of understanding ha binyere aka na mmalite ọrụ ha n’obodo ahụ.

O kwere nkwa na ya ga akpọturu isi ụlọrụ ha dina Abuja ka amara ihe emere tọhapụ onye ndu nke ntorobịa ahụ bụ Eugene Nwamgbo ka o nwere onwe ya.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited