Nwa amadi ahu ama ama na olu nta akuko igwe okwu akporo Broadcast Journalist bu Johnpaul Anih enwetala nzere mmuta ahu kachasi ukwuu na usoro agum akwukwo mahadum
Written by admin on February 20, 2025
Nwa amadi ahu ama ama na olu nta akuko igwe okwu akporo Broadcast Journalist ma buru onye ji Enugu mere onodu bu Johnpaul Anih enwetala nzere mmuta ahu kachasi ukwuu na usoro agum akwukwo mahadum akporo Doctor of Philosophy PhD na ulo akwukwo mahadum Enugu State University of Science and Technology ESUT.
Dr Johnpaul Anih jibukwara okwa onye enyemaka puru iche nyere aka chiburu Enugu State bu Ifeanyi Ugwuanyi na ihe metutara odimma ndi ntorobia nwetara yabu asambodo PhD na ngalaba omumu ihe Educational Management.
Na okwu ya oge onwetachara yabu nturu ugo mmuta taata bu Wednesday ka Dr Anih bukwu onye dere akwukwo ogugu akporo “Beyond Boundaries: Rethinking Nigeria’s Future” kwuputara mkpebi ya iji ubara mmuta ya tunye oke maka ezi mgbanwe na ngalaba agum akwukwo nakwa nke oha obodo.
Nwa amadi a jikwu okwa onye isi otu Postgraduate Students Union Govt yabu ulo akwukwo mahadum ESUT kowara ufodu ihe ima aka ogabigara na oge agum akwukwo ya, ebe okwuputaziri etu amara Chukwu siri nyere ya aka na nturu ugo mmuta a onwetara.
Dr Johnpaul Anih kwuputara obi ekene ya gaara ndi nyere ya nkwado na nturu ugo a dika; ndi ndumodu mmuta ya, ezinulo nakwa ndi enyi ya.
Iga echetazi na obu yabu Dr Johnpaul Anih ji okoloto otu ndorondoro Labour Party zoo okwa maka ogbonta vote Nkanu West State Constituency na ulo nzuko omebe iwu Enugu State House of Assembly na ntule aka ochichi izugbe were onodu na ala anyi na afo 2023.