Nwa amadi ahụ jibu ọkwa President nke ụlọ akụ African development Bank napụ apụ ugbua bụ Akinwunmi Adesina ekwuola ihe yiri ka à ga-asị na o nwere mmasị na ịzọ ọkwa onyeisi ala Nigeria n’afọ 2027.
Written by admin on February 11, 2025
Nwa amadi ahụ jibu ọkwa President nke ụlọ akụ African development Bank napụ apụ ugbua bụ Akinwunmi Adesina ekwuola ihe yiri ka à ga-asị na o nwere mmasị na ịzọ ọkwa onyeisi ala Nigeria n’afọ 2027.
Adesina mere ka amata na ya dị njikere ị gara ụwa niile ozi ma ọ bụ ala ndị isi ojii tinyere ala anyị bụ Nigeria n’ogogo ọbụla achọrọ ya malite n’oge ahụ ọkwa ya ga akụrụ ọnụ dịka onyeisi oche nke ya bụ ụlọ akụ.
Akinwunmi Adesina bụ onye ruburu ọrụ dịka minista hụrụ maka akọm ọrụ ugbo n’oge ọchịchị Goodluck Jonathan kwuru nkea n’oge yana ndị nta akụkọ na enwe mkparịta ụka n’igwe onyonyo Arise Television.
Ozi mere ka amata na ọ malitere ọrụ dịka onye President nke ya bụ ụlọ akụ African development bank n’afọ 2015 mana e mechara kpọlite ya ọzọ nke ugboro abụọ ya n’afọ 2020.
O kwuru n’otu ihe kacha enye ya obi aṅụrị bụ ịhụ na ya gbanwere ndụ ndị mmadụ ma mee ya ka ọ bụrụ nke kwanyere mma.
Na mgbe a jụrụ ya ihe ọzọ ọ ga-eme mgbe ọkwa ya kụchara ọnụ ma o nwere mmasị ịzọ ọkwa onyeisi ala Nigeria ka o mepere ọnụ were kwuo sị na ọ bụ Chineke ka ihe niile dị n’aka.
Mana nke ya mara bụ na ya dị njikere ị gara ala anyị ozi n’ogogo ọbụla achọrọ ya, kama n’ihe ka ya mkpa bụ ịgbanwe ndụ ndị mmadụ n’ụzọ ka mma.