Nwa amadi ahu jiburu okoloto otu ndorondoro All Progressive Congress APC azo okwa governor na Anambra state emela ka amata na ya anaghi akwa ariri na nkpebi ya igbahapu otu ndorondoro Labour Party.
Written by Onyinye on April 26, 2025
Nwa amadi ahu jiburu okoloto otu ndorondoro All Progressive Congress APC azo okwa governor na Anambra state bu Valentine Ozigbo emela ka amata,na ya anaghi akwa ariri na nkpebi ya igbahapu otu ndorondoro Labour party banye na otu ndorondoro APC.
Ozigbo bu onye nke banyere n’ otu ndorondoro APC tupu amalite ntuliaka ime ulo maka ndi governor, hapuru akwukwo ticket ya gara Nicholas Ukochukwu ma n’ akowa,na ya gbahapuru otu ndorondoro Labour party kwere maka na ihe n’ aga na yabu otu ndorondoro edoghi ya anya.
N’ okwu ya n’ oge ona esonyere n’ otu ihe omume n’ ulo mgbasa ozi onyonyo arise television tata bu Friday, ka yabu onye formal LP chieftain noro kwuputa nkpabi ya ibanye na otu ndorondoro APC dika okowara na ya emela ihe nile Ike kwere ya n’ otu ndorondoro Labour party kama na otu abughi n’ ezi.
N’ oge ona atu aka na ngbahapu nke ahu metutara otu ndorondoro people’s democratic party PDP na Delta state,ka Valentine noro kowa si, na ndi okwe ndorondoro digasi iche iche nwechara ebu m n’ obi ha ji abanye n’ otu ndorondoro ozo.
Nwa amadi kwuputara na ihe kpatara ya jiri banye n’ otu ndorondoro APC bu kwere maka na otu ndorondoro ndi nke ahu kachasi ama ya aka n’ iru anaghi aru olu. Tinyekwara ebu m n’ obi ya iwebata Anambra state n’ etiti.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.