OBARA EZOLA KA MMIRI NA IHE MBEREDE OKPORO UZO MEGASIRI NA MGBAGO UGWU NIGERIA
Written by admin on December 11, 2024
Opekata mpe mmadu isii ezutela onwu mberede ha na ihe mberede okporo uzo mere ohuru ozo na ogologo okporo uzo Awuyo/Adiyani Expressway dina Guri LGA nke Jigawa State.
Yabu odachi ka ozi kowara na obu na abali putara taata bu Wednesday ka owere onodu dika ogasiri naani abali abuo ihe mberede okporo uzo ozo mere na State ahu buru uzo napu mmadu iri na ano ndu ha na ike.
Ihe mberede okporo uzo nke ahu buru uzo mee na ubochi uka gara aga ka ozi kowara na obu na mpaghara Kafin Hausa dikwu na yabu Guri LGA na Jigawa State ka onoro mee.
Nke a mere na onu ogugu ndi nwuru anwu na State ahu nyere ihe mberede okporo uzo naani na ime abali abuo gbagoro mmadu iri abuo.
Ka osiladi, ozi kowara na mmadu isii ahu nwuru na ihe mberede okporo nke mere na abali putara taata bucha ndi sitere otu ezinulo.
Na oge ndi nta akuko wuchiri ogige Police Command Headquarters dina Dutse taata ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na yabu Jigawa State bu DSP Shiisu Lawan Adam mere ka amata na odachi a bu eziokwu.
DSP Adam gwara ndi nta akuko na nnyocha kana aga na iru ichoputa ihe butere yabu odachi, dika onyere ndi okpu ugboala ndumodu ka ha kwusi oke wawawa na okporo uzo, okachasi oge a mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru na akpudobe nso.
Na akuko ozo dika ibe ya, odachi ihe mberede okporo uzo emela ma taa isi onye Local Govt Chairman nke Katcha LGA na Niger State bu Hon Danlami Saku.
Yabu ihe mberede okporo uzo gakwara na iru nye mmadu abuo ndi ozo nona ime ugboala nwa amadi a nnukwute ihe mmeru aru.
Na oge ona akowa odachi a dika eziokwu taata bu Wednesday na Minna bu isi obodo yabu Niger State ka Commissioner State ahu na ahu maka okpuru ochichi ime obodo nakwa echimechi bu Hon Muazu Jantabo mere ka amata na obuna uhuruchi unya bu Tuesday ka yabu onye Local Govt Chairman nwetara odachi ihe mberede okporo uzo ahu.
Ogara na iru kowa na yabu odachi mere na ebe didebere imime obodo Kwakuti village nke ogologo okporo uzo Minna/Suleja Expressway.
Yabu Commissioner gwara ndi nta akuko na obu Abuja ka Hon Danlami Saku nakwa mmadu abuo ndi ozo ahu sitere Niger State emega njem oge odachi a mere.