Ochichi Ebonyi State Ekwuputala Njikere Ya Irutopu Olu Ngo Agbaghapugoro Na State Ahu

Written by on March 20, 2026

by Maduabuchi Onwe

Government Ebonyi state dina aka ochichi Gov Francis Ogbonna Nwifuru ekwuputala njikere ya ileba anya na oru ngo ndi ahu ochichi ndi nke pugoro apu nakwa ndi nke noo ugbu a gbaghapugoro na state ahu.

Ogakwara na iru mee ka amata na nke a so na mbo ya na agba ikwalite onodu akunuba state ahu ma webata mmepe obodo na mpaghara nille nke Ebonyi state.

Nke a putara ihe na ogbako otu council ukwu ochichi state ahu bukwanu nke were onodu na Abakaliki bu isi obodo Ebonyi state na odi nso a, dika ha fere ntutu taa na ha ga arutopu okporo uzo nille ndi ahu agbaghapuchara na imime obodo digasi ichiche okachasi ndi nke ahu di ntu kilometer abuo na state ahu.

Kosiladi, government Ebonyi state gakwara na iru maputa ukwutukwu ego di nde naria ise maka igo igwe ogbara ohuru eji ako ugbo ga adi nari abuo na iri ise maka akomo oru ugbo nke afo a bu 2026 na state ahu.

Ha mekwaziri ka amata na ha ga anwuchiko ndi obuna ji oru ngo enyere ha na state ahu wee mere ihe egwuregwu, okachasi ndi ahu na aru ulo akwukwo model secondary School ahu di iri abuo na abuo na state ahu.

Na ikpazu ka ha mere ka amata na ihe ndi ozo ha ga elebanya nke oma na state ahu gunyere: ogige aruike ogbara ohuru ga adi na obi government state ahu, otu ijeri naria na uma ato maka itinyegasi igwe ntu oyi na ogige izugbe azumahia nke Ebonyi state nakwa otutu ihe ndi ozo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited