Odeakwụkwọ ama ama bụ Prof Wọlé Soyinka esonyerela ogbo ya ndị ọzọ were katoo onyeisi ala bụ President Bola Ahmed Tinubu maka ịkwụputa amụma gbata gbata akpọrọ state of emergency nyere ọchịchị Rivers state.

Written by on March 24, 2025

Odeakwụkwọ ama ama bụ Prof Wọlé Soyinka esonyerela ogbo ya ndị ọzọ were katoo onyeisi ala bụ President Bola Ahmed Tinubu maka ịkwụputa amụma gbata gbata akpọrọ state of emergency nyere ọchịchị Rivers state.

Ọka mmụta Soyinka nọrọ n’oge ndị nta akụkọ na amịrị ya okwu n’ọnụ n’igwe onyonyo Channels television were kọwaa amụma ahụ dịka mmadụ imefe ihe n’oké ya.

Ịga echeta na onyeisi ala nọrọ na ọdị nso a kwupụta ọnọdụ gbata gbata nyere ọchịchị Rivers state kworo maka esemokwu metụtara ọgba aghara okwe ndọrọndọrọ ọchịchị.

Onyeisi ala nokwara n’oge ahụ kwụsị Gov Siminalayi Fubara na-achị state ahụ yana osote ya bụ Ngọzi Ọdụ ọrụ ha ihe ruru ọnwa isii.

President Tinubu mechara kpọlite ọchịagha jegoro ezumike nká n’ọrụ agha mmiri ala anyị bụ Rtd Vice Admiral Ibok Ete Ekwe Ibas dịka ònye sole administrator gana elekọta ọchịchị Rivers state.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited