Okwanu Na Nro Ka Akuko Oluebube Ahu Ana Ebughari Megide Ulo Uka Anyi Sitere – Uka Lord’s Chosen

Written by on September 17, 2024

Ndi nchikwa uka Lord’s Chosen Charismatic Revival church n’ ala anyi akowala ya dika akuko awarawa bu ozi onyonyo n’ efesasi n’ owa ozi mmekorita ohaneze mana egosi mmadu abuo uka ahu ebe hana enye akuko olu ebube Chukwu ruru na ndu ha nke ahu nwa bekee kporo “Testimony” n’ udi gbara ndi mmadu gharii.

Na yabu onyonyo owa ozi ka ahutara onye uka Lord’s Chosen ebe ona enye Testimony sina Chukwu ruru olu ebube na ndu ya site n’ izite odum nke nwa bekee kporo Lion biara nyere ya aka na njem ya.

Nwa amadi a kowara na yabu odum buru ya n’ azu buga ebe ona emega njem ruru otutu ntu kilometer ma mecha feere ya aka si ya gaa nke oma oge onyechara ya aka na njem ahu.

Ahutakwara onyonyo ozo ebe otu nwaanyi yabu ulo uka n’ akowa na Chukwu ruru ya olu ebube site n’ ime ya ka onwudo ndi oji egbe eri mmadu ato wakporo ya ma nasisia ha egbe AK-47 ha.

Nke a gbara otutu ndi mmadu gharii, ebe ufodu ndi mmadu n’ akowa ya dika akuko mgbama olu ebube eji asa ndi mmadu isi mana aghorikwa ndi aga aghorinwu.

Ufodu sitere n’ owa ozi kowa n’ okweghi omume ihuta odum n’ egbu agu ebe obiara kporo mmadu ma kwonye ya n’ azu kwoga ebe onye ahu n’ emega njem.

Ndi ozo sitekwara na yabu owa ozi mmekorita ohaneze kowa n’ ihe di etu a kwere omume ma elegara anya n’ ahutara olu ebube kariri nke a n’ akwukwo nso dika osiri di n’ olu ebube mere Daniel, David, Elijah nakwa otutu ndi ozo.

Ka osiladi, n’ okwu ya taata bu Tuesday ka onye isi ngalaba mgbasa ozi nakwa mmekorita ohaneze nyere yabu ulo uka Lord’s Chosen Charismatic Revival church bu Pastor Louis Chidi mere ka amata na habu ozi onyonyo bucha nke awarawa.

Pastor Chidi gwara ndi nta akuko n’ obuna nro ka ndi ahu kowara n’ ihe ahu ana ebughari n’ owa ozi mere ha.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies