Ọnọdụ ahụike Pope Francis akawanyela njọ n’agbanyeghị na ọ kwụsịla inwe nsogbu nke metụtara iku ume.

Written by on February 24, 2025

Ọchịchị nke obodo Vatican ekwuola si na ọnọdụ ahụike nke onye nlekọta ụlọ ụka nzukọ nsọ catholic n’ụwa niile bụ Pope Francis akawanyela njọ n’agbanyeghị na onwebeghi ka o siri gosipụta ọzọ metụtara iku ume.

Nwa amadi a kana enweta ikuku site na ọnọdụ nke akpọrọ high flow oxygen therapy ebe e mekwara ka amata na a gbanyere ya ọbara n’ahụ.

N’otu ọsịsa nnyocha e megoro ya na-egosi na o nwere nsogbu nke akpọrọ renal insufficiency yana nsogbu akụrụ akpọrọ kidney problem mana olileanya ka dị n’ime ihe ndị a niile.

Pope Francis ka e buru gaa n’ụlọ ọgwụ Gemelli Hospital dina Rome nke mba Italy n’abalị iri na anọ nke ọnwa Febrụwarị n’oge ọ malitere nwewa nsogbu nke iku ume bụkwa oge anọrọ gwọọ ya ọrịa akpọrọ bronchitis tupu ekwuo na o nwere oyi nke ime ahụ.

N’isi ụtụtụ ụnyaahụ bụ ụka bụ nwa afọ mba Argentina ahụ sonyere ogbo ya ndị ọzọ were chụọ aja Misa bụkwa oge ọ gwara ụwa niile ka ha cheta ya na ekpere.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies