Onu ego ana eregasi akurungwa na mba UK ariala elu orji

Written by on June 18, 2025

Onu ego ana ere akurungwa na mba UK nke afo a agbagola na percent ato na Uma ano n’ime onwa May gara aga.

Yabu inflation,nke n’ egosi etu onu ego ana eregasi ihe si aga noro n’ onwa gara ria elu orji dika akurungwa nri ihe eji ebigasi n’ ulo nakwa onodu obibi ndu n’ ari kwa ubochi.

Nwa amadi ahu ji okwa chancellor bu Rachel Reeves mere ka amata na aka nwere otutu ihe aga eme banyere nkea ebe chancellor Mel stride kowara na oke ngala onu akurungwa ndi a n’ atopuzi ezi n’ ulo di iche iche ogodo n’ ukwu.

N’ onwa April ka eweputara nguputa na onu ego ana ere akurungwa no na percent ato na Uma ano kama na ulo olu ONS mechara kowaputa n’ enwere ihe nkpobi ukwu na yabu nguputa, na okwesighi iru one ahu.

K’ osiladi, ulo oba ego mba England noburi na mbu me ka amata,na ha n’ atu anya na onu ego ana eregasi akurungwa ka ga agbagokwu na percent ato na Uma asaa n’ agbata onwa July ruo September tupu inaghachite azu na percent abuo aturu anya ya.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited