Ọnụ na ekwuchitere ndị uweojii na Imo State emela ka amata na nyocha na aga n’iru iji nwuchikọ ndị oji egbe aga gburu otu nwoke na State ahụ.

Written by on June 3, 2025

Ọnụ na ekwuchitere ndị uweojii na Imo State bu DSP Henry Okoye, emela ka amata na nyocha ka na aga n’iru iji nwuchikọ ndị oji egbe aga gburu otu nwoke a na enyeghi aha ya ma zọpụta nwunye ya ha tọrọ.

Ozi kọwara na nkea mere na mgbede Sunday na Golden Estate, Abba Father Avenue na Umuguma, dị na Owerri West LGA na State ahụ.

Onye ji anya hụ ihe mere bu onye na choghi ka akpọ aha ya kọwara ndị nta akụkọ ụnya bu Monday, na dị na nwunye ahụ so ndị na ere ala yabu land agents bịa ileta ala ha zuru mgbe ọdachi ahụ dakwasiri ha.

Kosila, ozi kọwara na oge nwoke ahụ gbanariri ha na ndị oji egbe aga ahụ jidere nwunye ya bu nke mere ka ọ laghachi azụ, dika ha gburu ma tọrọ nwunye ya, ebe ha hapụrụ ozu nwoke ahụ nakwa ụgbọala ya n’ebe ahụ wee rie mbọmbọ ọsọ.

Okoye mere ka amata na ndị uweojii amalitela nyocha iji nwuchikọ ndị oji egbe aga ahụ aka ha dị n’onwu nwoke ahụ ma kpụpụ ha n’ụlọ ikpe.

N’okwu ya, o kwuru na DPO nke Owerri West Division kpọrọ ndị uweojii ndị ọzọ dika ha na ndị vigilante group jikọrọ aka ọnụ na awaghari n’ime ọhia iji nwuchie ndị omekome ahụ ma zọpụta nwanyị ahụ ha tọrọ, dika ntụziaka Commissioner ndị uweojii siri dị.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited