Onye Attorney General nakwa Commissioner n’ahụ maka ikpe nkwumọtọ na Ogun State emela ka amata ihe gbasara otu nwa afọ Abia State atoghapuru site n’ụlọ mkpọrọ n’ọdị nso a.

Written by on July 11, 2025

Onye Attorney General nakwa Commissioner n’ahụ maka ikpe nkwumọtọ na Ogun State bu Oluwasina Ogungbade, emela ka amata na otu nwa afọ Abia State enyere aha ya dika Ogbonna Ogbojionu, bu onye atoghapuru site n’ụlọ mkpọrọ na ọdị nso a dika ọnọchara afọ iri abụọ na abụọ, bu onye atụrụ mkpọrọ maka izu ori, na ọbughi kwere maka izu Lister generator ezuru ezu dika osi n’efeghari n’ụwa ozi siri kwuo.

N’ozi Ogungbade binyere aka na ya ụnya bu Wednesday, boro ebubo na Ogbonna nakwa ndị otu ya gburu otu onye nche n’oge ha zuru ori ahụ bukwanu nke ha zuru na abalị atọ n’ọnwa October afọ 2000.

Ogbonna ghọrọ onye ana ekwu okwu ya na uwa ozi dika akụkọ etu o siri nweta nnwere onwe ya kwere maka etu aka na achi Abia State bu Governor Alex Otti siri tinye aka maka nweru onwa ya dika ọ goro na mkpọrọ afọ iri abụọ na abụọ.

Dika ọtụtụ ozi putagasiri n’ụwa ozi siri kwuo, na Ogbonna bu onye amara ikpe ọnwụ kwere maka ebubo na ọzụrụ Lister generator ezuru ezu, bụkwanu nke butara ajọ afa gara ngalaba ụlọ ikpe ala anyi a bu Nigeria.

Ozi ahụ gara n’iru kwuo na Ogbonna mere ka amata n’oge anwụchiri ya na afọ 1999, na amanyere ya ka ode akwukwọ ọ na aghọtaghi, kpe ya ikpe, ma makwa ya ikpe ọnwụ.

N’izaghachi okwu ahụ, Ogungbade kọwara na okwu ahụ bu asi, dika ọ kọwara na Ogbonna bu onye ekpere ikpe n’ụzọ iwu ma makwa ya ikpe kwere maka ihe omere dika iwu siri dị.

Na nkọwa ya gbasara ihe eji ma ya ikpe ọnwụ, onye Attorney General ahụ mere ka amata na abalị atọ n’ọnwa October afọ 2000 n’ihe dịka elekere iri nke abalị, na otu ndị oji egbe aga wakporo ụlọ ahịa mmanụ ELF station dị na n’okporo uzọ Abeokuta-Lagos road ma zuru otu 10 KVA Lister generator, ndị oji egbe aga ahụ jidere ma kechie ndị nche mmadụ abụọ n’ọrụ na filling station ahụ.

Ha ji igwe kụwa otu onye nche enyere aha ya dika Yusuf Akanni isi ma kujikwa ya ụkwụ, ha kụkwara onye nke abụọ enyere aha ya dika Moses Bankole isi, dika ha kekọrọ ha na abụọ ọnụ, ebe Moses Bankole zụtara ọnwụ ya n’ike n’ebe ahụ, ebe Ogbonna nakwa ndị otu ya bu Lister generator ahụ gbalaga.

Yusuf Akanni, bu onye nke nọ ndụ ma burukwa bu onye mbụ ebu ụzọ gba ajụ ajụjụ ọnụ na Ogun State, kọwara na Ogbonna bu onye na arụ generator yabu generator technician, bukwanu onye ji aka ya tọghapụta Lister generator ahụ n’ebe edobere ya na ụlọ ahịa ELF filling station ahụ.

Ọ gakwara n’iru mee ka amata na dịka mkpụrụ ụbọchị ole mole gachara, n’ihe dịka ojiri ọkara gafee elekere abụọ nke ọnụ ụtụtụ, na ndi uweojii hụtara ụgbọ ala bu nkụ nakwa ọtụtụ akpa mmiri na mpaghara Toll Gate, mana dika ha na eme nyocha, ha chọpụtara na ọ bu Lister generator ahụ ezuru ezu ka ha bu, n’oge ha jụrụ onye ọkwọ ụgbọ ala ahụ, Ogbonna nakwa otu onye ọzọ so ha enyere aha ya dika Kolawole Oladeji ihe gbasara generator ahụ, mana ha adịghị ike wepụta ihe aka ebe iji gosi na ọ bu ha nwe Lister generator ahụ.

Attorney General ahụ kọwara na onye ọkwọ ụgbọ ala ahụ nakwa Oladeji hapụrụ Ogbonna riri mbo mbo ọsọ n’oge ndị uweojii ka na enyocha ụgbọ ala ahụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited